Afcon 2019: Ndị ama aha ha ga-asọ mpi n'Iko Mba Afrịka taa

Wilfried Zaha

Ebe foto si, Reuters

Asọmpi atọ kara aka ga-esu taata iji mata n'ime mba isii ndị ga-aga agba nke abụọ nke Iko Mba Afrịka na-aga n'ihu ugbua na Ijjpt.

Avịrị Koost, Moroko, Tunishia na Mali bụ mba ndị otu egwuregwu bọọlụ ha ga-asụ mpị na Fraịde a nke akpọpụta ndị ama aha ha ama n'egwuregwu bọọlụ n'ọgbọ egwuregwu.

Kedu ndị ga-agbaka ibe ha?

Mali na Tunishia ga-ezute na ogige ngalaba "Group E" na Suez n'elekere atọ na ọkara n'ehihe.

Tunisha na-enyo ịnata mmeri mbụ ha n'asọmpị a mana nọchịri ha ụzọ - Mali ga-agafe ma ha merie.

Ndi bọọlụ dị ka Wahbi Khazri, Naim Sliti na Yassine Khenissi bụ ndi a na-ache na ha ga-enye Tunishia ohere ịnata ugo mbụ ha na asọmpị a.

Na Mali, Mousaa Marega bụ otu onye nwereike nye Tunisha nsogbu.

Hakim Ziyech

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ziyech nyere Ajax aka ruo mgbacha 'Champions League' nke afọ a

Moroko naAvịrịKoost

Asọmpi a bụ nke ọtụtụ mmadụ na-atụ anya dịka otu egwuregwu abụọ a bụ ndị egwu ha na-amasị ndi mmadụ.

Hakim Ziyech nke Ajax bụ otu onye anya ga-achado, ọ kachasị ka o wetachara otu ahu aka ruo ọkara Iko Champions League nke afọ a.

Ọ bụ Moroko kụpụrụ Avịrị Koost n'ọgbọ n'asọmpi nke 2017.

Onye nkuzi ha bụ Herve Renard nwere olileanya iburu Iko Afcon nke atọ ya.

Moroko merie Avịrị Koost, ha ga-eji pọịntị isii mana ha ga-achọ enyemaka ndị dị ka Sofiane Boufal na Younes Belhanda.

Avịrị Koost kwesiri imeri iji gafe dịka Naịjirịa, Ijipt na Ọljirịa bụ ndị gafelara ga-agba nke abụọ.

Lebo Mothiba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lebo Mothiba

Saụt Afịrịkana Namibia

Mba abụọ a bụ agbataobi ga-ezute onwe ha ka ha achịtaghị aja mgbe ha na Avịrị Koost na Moroko zutere.

Percy Tau na Lebo Mothiba bu ndi egwuregwu Saụt Afịrịka ga na-achọ inye goolu mbụ ha na Afcon n'egwuregwu.

Aha onyonyo, Nigeria VS Guinea: Lee ihe ụmụ Naijiria na ekwu maka mmeri Super Eagles meriri