Ndidi Vs Kante: Ihe ndị egwu bọọlụ a ji ewu na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nwafọ Naijiria na-agbara Leicester City Bọọlụ bụ Wilfred Ndidi aghọọla okwu a kpụ n'ọnụ ka a kpọpụtachara ya dịka onye kara chakee na asọmpị Naijiria na mba Burundi n'izu gara aga.

Ọ chakekwara oge Naijiria zutere mba Guinea n'ụbọchị Wenezdee.

Ọ bụ nchake ahụ kpalitere mụọ ụfọdụ ụmụ Naijiria ha were bido iji Ndidi tụnyere Kante bu onye mba France na-agbakwara ndị otu egwu bọọlụ Chelsea nke Ịngland.

Okwu ahụ bidoro ndọrịtaụka pụrụ ọkụ.

Ụfọdụ kwuru na Ndidi bụ egwu e ji n'ime ndị na-agba etiti.

@realoladele kwuru na Ndidi ka Kante mma.

@QdPaper kwuru na Ndidi ka mma mana ihe mere bụ na o nweghị ndị na-egburu ya opi

Ụfọdụ kwuru na o nweghị ka ọdụ egbe na ogene siri yie.

@josagana sị na ọ bụ mkpalị nye Kante iji Ndidi tụnyere ya.

@blacky kwuru na iji Ndidi tụnyere Kante gosiri na ụmụ Naijiria ka n'isi ma kwesị ka ndị ọcha chịa ha ọzọ.

@Qwarmie_J kwuru na ya bụ okwu bụ okwu ndị amaghị nke a na-akọ.

Akụkọ ga-amasị gi: