Presidential Election Tribunal: Ụlọikpe mkpesa ntuliaka ekweghi ka Atiku nyochaa 'Server' Inec

Ụlọikpe mkpesa nke akpọrọ "Nigeria Presidential Election Petitions Tribunal" na Bekee akagbuola atụmatụ pati na-anọghị n'ọchịchị bụ "People's Democratic Party" (PDP) inyocha igwe "server" ngalaba ntuliaka "Independent National Electoral Commission" (Inec).

Ndị Ọkaiwu ise nọ na ngalaba a sị cha cha ma ncha na ha agaghị ekwe n'arịrịọ PDP na onye zọrọ ọchichị n'okpuuru ha bụ Atiku Abubakar maka ihe ndị ọzọ metụtara okwu "server" a.

Ọkaiwu ndị a sị na ha agaghị etinyenwu ọnụ n'okwu "server" n'oge a.

Na mkpebi ha, Ụlọikpe a sị na Inec agọọla na ha enweghị "server" ma kwukwa na ha ejighị usoro tecknuzu ọbụla kpokoo ọnụọgụgụ vootu gaa "server" ọbụla dịka PDP na Atiku siri kwuo.

Ha sị ya bụrụ na ha nyere Atiku na PDP ihe ha na-arịọ, ọ pụtara na ha amalitela isiokwu mgbe na-erughi eru.

Ọkaiwu Garba, bụ onye gụrụ mkpebi a sị: "Nke ahụ agaghị enwe isi."

Ọ sị na ya bụrụ na Ụlọikpe ahụ kwenyere n'ihe PDP kwuru, ọ ga-apụta na ha "ekwerela na enwere "server" ebe ọnụọgụgụ vootu atutara na ntuliaka emere n'ụbọchị 23 nke Febụwarị bara."

Akụkọ ga-amasị gị: