9th Assembly: Ọ dịghị mfe ịchịcha dịka gọvanọ ma bụrụ Sịnetọ - T.A Orji
Sịnetọ T.A. Orji na-anọchite anya mpaghara Abia Central n'ụlọomeiwu sị na ọ dịghị mfe mmadụ ịchịcha dịka gọvanọ steeti ya ma merie kwa n'ịzọ ọkwa sịneti.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Aka chiburu Abia Steeti kwuru na onye gọvanọ ọbụla zọrọ ọkwa sịneti ma merie gosiri na ọ rụrụ ọrụ ya nke oma.
Ọ sị na ọ bụ n'ihi nke a mere ndị ebe ha ji sị ya gaa n'ọchite anya ha ọzọ n'ụlọomeiwu.
Orji gara n'ihu kpọpụta ihe ndị ọ ga-emere ndị Abia Central dịka onye na-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu nke Naịjirịa.
Kirie ihe o kwuru n'uju;

