You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rochas Okorocha: A hapụrụ m naira 42.5b n'ọba ego Imo steeti
Aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ hapụrụ ego ruru Ijeri naira iri anọ na abụọ n'ụma (N42.5 billion)n'ọba ego Imo steeti.
O kwuru na ọ chọrọ ka Emeka Ihedioha na-abata ọkwa gọvanọ ghara inwe ihe ọbụla ga-ebochi ya ịrụpụta ọrụ gọọmenti.
O kwuru nke a mgbe ọ na-ahọpụta ndị odee akwụkwọ na onyeisi ndị ọrụ steeti ya.
Ọdachị eriele isi mmadụ isii na Plateau steeti
Ndị omekome egbuola mmadụ isii n'otu ezinụlọ n'okpuruọchịchị Riyom dị na Plateau steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Matthias Tyopev kwetere na ihe mberede a mere mana ọ matachabeghi ka o si mee.
Mbanye ọchịchị ọhụrụ
Dịka Legọọs na Abia steeti nwurula ọkụ maka nnyefe aka ọchịchị ọhụrụ 2019 na-enwuru ọkụ na Naịjirịa.
Gọvanọ Abia steeti na-enyefe onwe ya ọchịchị hibere ọgbakọ ọ ga-eji gosi ndị steeti ahụ ka ọ ga-esi chịa ha n'agba nke abụọ ya.
Gọvanọ meriri na Lagos bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na gọvanọ Ambode na-apụ apụ enyefela ọchịchị Lagos n'aka ya tupu echi bụ mmemme nyefaka ọchịchị eruo.
Buhari emepela iko mmanya ọchịchị agba nke abụ
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na dịka ọ na-abanye agba ọchịchị nke abụọ na ọ ga-agba mbọ hụ na ndị uweojii na ndị ọkaiwu rụrụ ọrụ ha ọfụma.
Ọ rịọrịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gba ndị omekome nọ n'agbataobi ha n'anwụ ka obodo naịjirịa nweike ịdọbata ndị oji ego achụ ego si mba ofesi.
N'ofesi
Ụlọikpe di n'mba South Africa akpụpụla Nwoke ọnye isi ọcha south Africa aha ya bụ Adam Catzavelos ikpe maka ihe onynyo ịkpa Oke agwụrụ ọ mere.
O mechara zipu ozi rịo mgbaghara sị na ọ bụ aghọtaghị , kwu kwa na ọ ga eji ndu ya nile echegharị agwa ọjọ ọ kpasoro ndị isi ojii na mba South Africa.
Ọtụtụ anwụọla na nrigoro Ugwu Everest
Ka akụkọ na-aga, a na-ekwu na ihe karịrị mmadụ iri anụọla n'ugwu Everest kemgbe afọ a.
Ọgụ n'ụlọ mkpọrọ na mba Brazil ataala isi mmadụ
Mmadu iri anọ anwụọla n'ọgụ dara n'ụlọ mkpọrọ dị na mba Brazil dịka egbuchara ndị ụlọ mkpọrọ iri na ise na ọgụ dara ụbọchị Sunday gara aga na mba ahụ.
Ndị ọrụ mkpọrọ na-ekwu na o nwereike ịbụ enweteghị ikuku ọfụma kpatara ọnwụ ndị a.
Na Japan
Oji mma egbu awakpola ụmụakwụkwọ nọ na ebe ha na-eche ụgbọala ha ji a ga ụlọakwụkwọ na mba Japan
Mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo.
Nwata dị afọ iri na otu nakwa nwoke dị iri atọ na itoolu so na ndị eji mma mabuo n'ihe mberede a.
N'egwuregwu
Onye na-agbara otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid bụ Sergio Ramos ekwuola na ọ chọrọ ịpụ n'otu ahụ na-akwụghị ụgwọ orire ya.
O kwuru na ọ chọrọ ị ga otu egwuregwu bọọlụ China agbanyeghị na onyeisi Madrid gwara ya na ọ gaghị ekwe ka ọ pụọ na nkịtị.
USA ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Naịjirịa.
Otu egwuregwu bọọlụ Naịjiria emeghi ihe ha mere ndị Qatar na mmepe asọmpị iko Fifa U-20 dịka ha achịtaghị aja n'ebe otu egwuregwu USA nọ ka ha zutere onwe ha ụnyahụ.
Ha mechara jiri ọkpụ goolu abụọ asataghị otu wee merie Naịjirịa.
Naịjirịa na Ukraine ga-ezute n'ụbọchị tọzdei na-abịanụ.
Nkeji taata