NCAA strike: Ndị ọrụ ụgbọelu n'Enugwu esorola ndị ogbo ha gbaa abụbọ ọrụ

Otu na-ahazi ka ọrụ ọdọ ụgbọ elu si aga bụ NCAA na aha ịchafụ ngalaba nke Enugwu ekwuola na ha agaghị arụ ọrụ ọbụla ganye n'ụbọchị atọ agafee.

Mgbe BBC Igbo gara n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu, ụlọọrụ ndị NCAA gbachiri agbachi ebe ndị ọrụ na-agagharị na-arụghị ọrụ ọbụla.

Onyeisi ya bụ ụlọ ọrụ n'Enugwu nke ekweghị ka agbaa ya ajụjụ ọnụ n'ihe onyonyo gwara BBC Igbo ihe ha chọrọ ka gọọmentị mee.

Nke mbụ bụ ka gọọmentị mee ka ọnọdụ ndị ọrụ ụgbọelu bụ NCAA n'ịchafụ na-adị mma na Naịjirịa.

Ha chọkwara ka ego ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha gbalite n'ogo.

Ọ gwara n'ihu kwuo na ha akwụsịghị mfepụ na mbata ụgbọelu n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu steeti.

Akụkọ ga-amasị gị: