Climate Change: Ndị uloomeiwu ukwu chọrọ ịchula akpa wakịrị wakịrị

Ndị ụlọomeiwu ukwu asaala anya n'mmiri hụta na ọ ga-abara mbara ezi Naịjirịa uru ma egbochie ma kwụsi iji akpa wakiri wakiri eme ihe ọbụla n'obodo Naịjirịa.

Ha na-ekwukwa na iwua gafee, na ọnye enwetere na-ere akpa wakiri wakiri nwere ike ị ga nkpọrọ ruo afọ ise.

Onye ka akpa wakịrị wakịrị nọchịrị ụzọ?

Onye ọkammụta sayensi na-ahụ maka mbara ezi aha ya bu Oyeronke Adegbile ekwuola na akpa wakiri wakiri ezila mbara ezi Naijiria ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Ọ na-ekwu na akpa wakiri wakiri a na-ebute ide mmiri, na-egbu kwa anụ nọ na mmiri dịka mbe, azụ na anụ ndị ọzọ, ma soro kwa na-eme ka mbara ezi anyị jọọ njọ.

Na aka nke ọzọ, ndị na-eme akpa wakiri wakiri a na ndị na-eji ya ere ahia maọbu eme ihe di iche na ebe akwa na si " kedu ka anyi ga e si mee ugbua ?"

Ihe ndị ọzọ ga-anọchịte anya akpa wakịrị wakịrị

Oyeronke Adegbile na-akọwa si na enwere ike iji ngwa ndi ozo di ka akwa ma ọ bu mpe-mpe akwụkwọ were nọchie ọnọdu akpa wakiri wakiri na Naịjirịa.

Mba kenya, Rwanda, Mauritania, Morocco, South Africa,Tanzania, tinye kwa Taraba steeti na Naijiria na-eri elele mbara ezi mara nma kemgbe ha tinyere iwu igbochi akpa wakịrị wakịrị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: