Third Mainland Bridge: Ọkụ agbapịala ụgbọala n'elu ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ihe onyonyo gosiri ebe ụgbọala ahụ na-agba ọkụ n'ụtụtụ Wenzde.

A mabeghi ma o nwere onye merụrụ ahụ na ya bụ mberedere mere n'akwa mmiri Third Mainland.

Dịka ọ dị ugbua ndị ọrụ gbatagbata emenyụọla ya bụ ọkụ ma na ahazi ahịrị ụgbọala ebe ahụ.

Okwu Obasanjo bụ ụdịrị okwu nwereike ikewa Naịjirịa

N'Abuja ka Minista na-ahụ maka mgbasa ozi gwara ndị ntaakụkọ na okwu Obasanjo kwuru bụ ụdịrị okwu nwereike ịkewa Naịjirịa.

Cheta na aka chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kwuru na Boko Haram na otu na-eyi ndụ egwu ndị ọzọ chọrọ ị mee ka ala Naịjirịa na ala Afrịka niile bụrụ mba Alakụba.

N'akụkọ ọzọ,

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ndị na-akwado Inec gbasara asambodo mmeri ya bụ bụkwa ndị ji EFCC enyocha ya.

Dịka onye enyemaka ya bụ Sam Onwuamedo siri kwuo "ọ bụ ọrụ EFCC inyocha ndị mmadụ mana ha ekwela ka e metọọ ha n'ụzọ ezighi ezi"

Na mba ofesi

Mmadụ puku ole na ole apụtala ịme ngagharị iwe maka iwu machiri ite ime n'obodo Arkansas, Kentucky, Missouri, Ohio nakwa Georgia na mba Amerịka.

Iwe ha bụ na mmachi ite ime mgidere oke ruru nwaanyị gbasara ahụ ya.

Super Falcons nke Naịjirịa "atụọla down" na mba Austria

Otu Super Falcons nke Naịjirịa "atụọla down" na mba Austria ebe ha ga-anọ rue izu ụka abụọ na-akwado maka njem ịbụlata iko mba ụwa nke ụmụ nwaanyị.