You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cannabis: Gọọmentị Naịjirịa ọ chọziri ị na-akụ 'igbo'?
Ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa nọ na mba Thailand ịmụta etu e si akụ 'igbo'
Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọgwụike (NDLEA) bụ Mustapha Abdallah na gọvanọ Ondo Steeti bụ Rotimi Akeredolu so mee njem ahụ.
Kọmshịọna na-ahụ maka mgbasaozi na Ondo Steeti gwara BBC na gọvanọ ha na onyeisi ndị NDLEA gara mba Thailand iji chọpụta etu ha ji akụ igbo.
N'okwu ya "A bịa na mpaghara Ugwu nke Naịjrịa ndị na-akụ igbo na ndị ọrụ NDLEA nọ n'ọgụ na mgba oge niile, mana gọvanọ a bịara kwuo ma onwere ihe ndị ọzọ bara uru a na-eji igbo eme,"
O kwuru na njem ha mere na Thailand bụ ịchọpụta ohere eji akụ igbo n'ebe o buru ibu na Ondo Steeti ma gbasa kwa ya.
Gọvanọ Steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu dịka ọ nọ na Thailand kwuru na Ondo steeti bụ ebe ama ama kachasị n'ịkụ igbo.
"Anyị nọ ebe a ị chọpụta etu igbo ga-eji baara steeti na Naịjirịa uru dịka etu gọọmentị mba Thailand jiri mee. Ha na-eji igbo akwọ ọrịa dị iche iche; etu a ga-eji akụ ya maka n'ụzọ dị mma na abụghị nke ọjọọ" o kwuru.
Dịka ọ dị ugbua igbo bụ ọgwụike a machiri amachi na Naịjirịa, ndị na-akụ, na-ere, na-aṅwụ ya nwereike ị ga mkpọrọ.
Mana mba ndị dịka Uruguay, Canada na Saụt Afrịka mere ka ọ bụrụ ihe a nabatara n'ụzọ dị iche iche.