You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Caramelo Lounge: Ọ bụ obi ọjọọ ka eji kwatuo ụlọ oriri na nkwari a
Ọ bụ eziokwu na akwatụrụ ụlọ awantịlọ Caramelo nso nso a mana ọtụtụ mmadụ anabatachaghị ya bụ atụmaatụ.
Onye ọkaiwu ama ama aha ya bụ Goody Uwazuruike ekwuola na ọ bụ obi ọjọọ ka ndị ụlọ ọrụ kwatụrụ ya bụ ụlọ ji mee ya.
N'ọnụ okwu ya, "Ndị a kpara agwa a ka ndị otu Sharia na-eme tigbuo zọgbuo maka obibi ndụ ndị ọzọ na-amasịghị ha."
Uwazuruike kwuru na ihe ziri ezi ha kwesiri ime mgbe ha nwetere mkpesa ndị bi n'akụkụ bụ ịkpụpụ onye nwe ya bụ ụlọ orirri ụlọikpe.
O kwuru na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebizi ihe a ga-eme ya bụ ihe.
O nyekwara onye nwe Caramelo ndụmọdụ ya ga n'ụlọikpe ga kpesa ya bụ nkwatụ akwaturu ụlọoriri ya makana ọ gba nkịtị ihe kaa nke a ga-eme ọzọ.
Cheta na akụkọ pụtara na gọọmenti Abuja kwatụrụ ụlọoriri na nkwarị Caramelo dị na Utako ka otu izu ụka gachara ndị uweoji ji nwụchie ụmụnwaanyị echere na-agba ọwantịlọ na ebe ahụ.