Caramelo Lounge: Ọ bụ obi ọjọọ ka eji kwatuo ụlọ oriri na nkwari a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ bụ eziokwu na akwatụrụ ụlọ awantịlọ Caramelo nso nso a mana ọtụtụ mmadụ anabatachaghị ya bụ atụmaatụ.

Onye ọkaiwu ama ama aha ya bụ Goody Uwazuruike ekwuola na ọ bụ obi ọjọọ ka ndị ụlọ ọrụ kwatụrụ ya bụ ụlọ ji mee ya.

N'ọnụ okwu ya, "Ndị a kpara agwa a ka ndị otu Sharia na-eme tigbuo zọgbuo maka obibi ndụ ndị ọzọ na-amasịghị ha."

Uwazuruike kwuru na ihe ziri ezi ha kwesiri ime mgbe ha nwetere mkpesa ndị bi n'akụkụ bụ ịkpụpụ onye nwe ya bụ ụlọ orirri ụlọikpe.

O kwuru na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebizi ihe a ga-eme ya bụ ihe.

O nyekwara onye nwe Caramelo ndụmọdụ ya ga n'ụlọikpe ga kpesa ya bụ nkwatụ akwaturu ụlọoriri ya makana ọ gba nkịtị ihe kaa nke a ga-eme ọzọ.

Cheta na akụkọ pụtara na gọọmenti Abuja kwatụrụ ụlọoriri na nkwarị Caramelo dị na Utako ka otu izu ụka gachara ndị uweoji ji nwụchie ụmụnwaanyị echere na-agba ọwantịlọ na ebe ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: