EFCC akpụpụla onye ọrụ ụlọakụ ụlọikpe maka igwu wayo N187m

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Akụkọ ndị dị mkpa:

EFCC akpụla onye ọrụ ụlọakụ ụlọikpe maka ikwu wayo N187m

Oliver Anidiobi

Ebe foto si, EFCC

EFCC ngalaba nke Enugwu akpụpụla Oliver Anidiobi, onye bụbụ onyeisi ngalaba ụlọakụ( a chọghị ịkpọ aha ha) n'ụlọikpe ukwu dị n'Enugwu maka ebubo ikwu chamdum nde otu narị naira na iri asatọ na asaa.

A na-ebo Anidiobi ebubo iji ọkwa ya dịka onye na-ahụ maka akpaego obere ụlọakụ a kpọrọ 'OHHA Microfinance Bank' napụta ha ego ruru N187 ma zupu ya were ya rụọ ụlọelu ma zụkwa ala n'ebe dị iche iche. n'Enugwu.

Ọ bụ mgbe obere ụlọakụ ahụ chọọ imechi agbaego ha nwere n'ụlọakụ ahụ ka ha chọọpụtara na ego ha adaala mmiri.

Oge a gụpụtara ebubo ndị e boro Anidiobi nke gụnyere ịkpụ akwụkwọ nakwa izu ego ụlọakụ, o kwuru na 'ikpe amaghị ya.'

Okaikpe Ajah, onye lebanyere anya n'ikpe ahụ higharịrị ikpe ahụ rue abalị asaa nke ọnwa Juun ma nye iwu ka a tụnye Anidiobi na mkpọrọ.

Onye Naijiria abụrụla onyeisi gbakọ United Nations

Tijjani Mohammad Bande

Ebe foto si, Bashir Ahmaad

Ọkammụta Tijjani Mohammad Bande abụrụla onyeisi ọgbakọ United Nations ọhụrụ.

Ọ bụ onyeisi nke na-apụ apụ bụ María Fernanda Espinosa Garcés gbara nke a n'anwụ na mkparịtaụka ha na Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Geoffrey Onyeama n'obi gọọmentị dị n'Abuja.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ndị na-egosi iwe n'Abuja

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ bụkwa n'Abuja ka ndị na-eme ngosiwe gbochiri ụgbọala ọsote aka na-achị Naịjirịa bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo.

Iwe ha bụ na ndịagha na-achọ ịnapụ ha ala ebe ha bi dịka Ọkammụta Osinbajo kwere ha nkwa na ọ ga-elebanye anya na okwu ahụ.

Na mba ofesi,

Ndị Aṅarị

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii na mba Mozambique anwụchiela mmadụ abụo eboro ebubo na ha tọrọ ma kwọgbuo ọtụ nwatakịrị anyarị na mba ahụ.

Ndị uweojii kwukwara na ndị ahụ anwuchiri ekwetaala na aka ha dị n'ọnwụ nwa ahụ.

N'egwuregwu,

Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Getty Images

Onye na-achịkọta otu Super Eagles nke Nịajirịa bụ Gernot Rohr ekwuola na o nwere olileanya na-aga ahazi okwu gbasara Samuel Chukwueze

Cheta na otu Villareal bụ ebe Chukwueze na-agba ekweghi hapụ ya soro gbaa n'asọmpị iko mba Afrịka.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ipob agbarụọla ihu nye ndị ọchịchị

IPOB

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, IPOB na-ewe iwe gbasara egwu eke ndi agha Naijirịa gosiri n'Abia steeti

Ipob agbarụọla ihu maka nkatọ Dave Umahi, Willie Obiano nakwa Nnia Nwodo katọrọ atụmatụ ịgba abụbụ site na-ịtụkwụ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee.

Onye ozi Ipob bụ Emma Powerful sị na ndị isi a dị mma ịmere ebere maka uche ha dị na-azụm ahị otu ụbọchị karịa nwere onwe Biafra.

Global Road Safety week: Onye Road Safety ọbụla e jidere na-eri ngari ga-ata ahụhụ - FRSC

Ndị ọrụ nchekwa njem okporoụzọ
Nkọwa foto, Ndị ọrụ nchekwa njem okporoụzọ

Mmemme ncheta izu ụka ndị ọrụ nchekwa n'okporoụzọ nke a kpọrọ 'Road Safety Week' amalitela n'Enugwu.Isi okwu mmemme ahụ nke afọ a bụ"Leadership for Road safety."

Dịka Sector Commander FRSC , Ogbonnia Kalu siri gwa ndị ntaakụkọ n'Enugwu, gọọmentị nke etiti, nke steeti nakwa United Nations ejikọla aka ịhụ na-echekwara ndụ ndị mmadụ.

Kọmishịọna na-ahụ maka njem bụ Vitus Okechi gwara ndị FRSC na ndị ọrụ ya ga na- adọnyere ndị ọrụ nchekwa okporouzọ ukwu oge niile.

Ndị ọrụ nchekwa njem okporoụzọ

Okechi gwara ọha ndị mmadụ, ka ha wetara ya aha ndi ọrụ ya ọbụla na-akpa agwa ekwesịghị ekwesị.Iji zaa ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ , Sector Commander Ogbonnia Kalu kwuru na onye ọrụ ya ọbụla e jidere ka ọ nara akaazụ ga-ata ahụhụ dịka iwu Naijiri siri kwuo.

George Weah akwụsịla Mịnịsta mgbasaozi ya ọrụ n'ike maka okwu asị

George Weah

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, George Weah bu onye gbaburu boolu tupu ọ banye n' ndọrọndọrọ ọchịchị

Onyeisiala mba Liberia agwala osote mịnịsta mgbasaozi mba ahụ bụ Eugene Fahngon ka ọ nọtụ n'ụlọ nwa oge maka okwu ịkpa oke agbụrụ o kwuru n' igwe okwu Facebook ya.

Nke a na-eme dịka mba Amerịka katọchara okwu ahụ Fahngon kwuru.

Fahngon katọrọ ngagharịiwe megide gọọmentị nke e hiwere ga-eme n'abalị asaa nke ọnwa Juun nke o boro ndị sị n'agbụrụ ndị ohu a tọhapụrụ atọha site na mba Amerịka ndị ọ kpọrọ 'ndị Liberia si Congo.'

N'ozi ha wepụtara, ụlọnnochịte anya mba Amerịka na Liberia sị n'okwu ahụ ekwesịghị ekwesịghị.

Ha kpọrọ oku ka onye ọbụla lekwasị anya n' kwalite obodo na ịkpa udo.

Ụlọikpe atọhapụla Adeleke ma higharia ikpe ya

Ademola Adeleke

Ebe foto si, @IsiakaAdeleke1

Nkọwa foto, Ademola Adeleke zọọ ọkwa gọvanọ Osun steeti n'aha PDP n'afọ 2018

Ụlọikpe majie nke Mpape dị n' Abuja atọhapụla Senatọ Ademola Adeleke, onye zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'ọnụ egọ nde naira abụọ ma higharịa ikpe ahụ n'abalị 24 nke Juun afọ 2019.

Cheta na ndị uweojii nwụchiburu Adeleke taa maka ebubo ' ịkpụ asambodo adịgboroja.'

Ndị PDP na-ebo ebubo na njide a bụ ka e were megharịa Adeleke anya maka mkpụpụ ọ kpụpụrụ otu APC n'ụlọikpe maka ndọrọndọrọ okwa gọvanọ o kwenyere na ya meriri.

Boko Haram akaghị ndị agha eri ụkwọ

Ndị agha Boko Haram

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkuzi bekee bụ arụ

Ndị otu mgbasa ozi onyeisiala Buhari ekwuola na ebubo na Boko Haram ka ndị agha Naịjirịa eri ụgwọ ọnwa bụ ajambele.

Onyeisi ndị otu a bụ Niyi Akinsiju kwuru na kama, agụụ na anyụ ndị Boko Haram anya maka ụdịrị agha a na-ebuso ha ugbua.

Prime Minister Australia agwọrọ odeshi?

Scott Morrison Prime Minster Australia

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Scott Morrison Prime Minster Australia

N'ofesi, Prime Minister mba Australia aghọọla oji isi aghọ mgbo.

Atụrụ scott Morrison akwa n'isi ebe ọ na-achụ nta vootu mana akwa ahụ akụwaghị, kama ọ gara kwatuo otu agadị nwaanyị kwụ na akụkụ.

Man. City emeriela Liverpool

Man. City na Liverpool

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Man. City 1 - 0 Liverpool

N'egwuruegwu e, Manchester City gara be mmuo napụta Leicester city otu ọkpụ goolu ha jiri merie ha na Premier League ụnyahụ.

Mmeri a mere ka Man City bụrụ akwaa akwụrụ dịka ka ndị mbụ na ogoogo Premier League.

Ụlọikpe atọghapụla Adeleke ma higharia ikpe ya

Gee Nkeji Igbo ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị