Ndị Gọvanọ ga-esepụ aka n'ego okpuruọchịchị - NFIU

Ego Naíjiría

Ebe foto si, Getty Images

Ngalaba ọhụrụ ehibere maka etu ego si agbasa na Naịjirịa enyela iwu ọhụrụ.

N'akwụkwọ ozi ha weputara nke BBC hụrụ anya, ha gwara ndị gọvanọ ka-esepụ aka n'ego ndị okpuruọchịchị.

Ha kwukwara na ego kachasị enwereike ịsepụta n'otu mgbe bụ puku narị naira ise.

Ha kwuru na nke a bụ iji kwụsịlata oke mpụ na nrụrụaka ego na-arị ibe ya elu gbasara ego.

N'ebe ọzọ na Naịjirịa,

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii n'Anambra steeti anwụchiela otu nwoke ha boro ebubo na aka ya dị n'ọnwụ Anthony Igboka nke obodo Nimo.

Cheta na ndị abali dị egwu gbagburu nwoke ahụ n'ahịa dị na Nimo n'ọnwa Eprelu.

Ọ bụ nwoke!

Nwunye onye isi Sussex

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ime emewela Meghan Markle bụ nwunye Ọkparaeze Harry nke mba Briten.

Ọ bụrụ na ọ mụọ ya bụ nwa ọ ga-abụ mmadụ asaa nwereike ịwere oche eze mba Briten.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ọkụ tanka mmanụ agbagbuola mmadụ 55

Tanka mmanú gbara ókú

Ebe foto si, Getty Images

O pekata mpe mmadụ 55 anwụọla ka ụgbọala tanka bu mmanụ ụgbọala gbara ọkụ n'obodo dị nso na Niamey, isiobodo mba Nijie taa bụ Monde.

Onyeisi nchekwa ndị mmadu na mba Nijie bụ Colonel Boubacar Bako kwuru na ihe mberede ahụ mere n'abalị na nso ọdọụgbọelu.

Ụgbọ bu mmanụ dara, ndị mmadụ bidoro na-eku mmanụ tupu ọ gbaa ọkụ, gbuo ọtụtụ mmadụ.

Praim Mịnịsta mba ahụ na ọtụtụ ndị mịnịsta ndị ọzọ agala ebe ya bụ ihe mberede mere tupu ha gaa ụlọọgwụ iga leta ndị merụrụ ahụ.

Anambra chọọ ịrụ ụlọmkpọrọ ụmụaka

Ụlọmkpọrọ ụmụaka

Anambra steeti agbatala ala n'Umunze, Orumba North ebe ha ga-arụ ụlọmkpọrọ maka ụmụaka dara iwu.

Gọọmentị steeti ahụ sị na ọ bụ ebe ha ga na-agbaziri ndị isiike ụzọ.

Ụlọikpe chọrọ ka ụlọakụ kwụọ ụgwọ eji ndị ọrụngọ n'Imo steeti

Ikpe nkwụmọọtọ

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile

Ụlọikpe ukwu na-eche maka ịmanye ụlọakụ iri na anọ ya na Central Bank nke Naịjirịa ka ha kwụọ otu ijeri naịra ha sị na ha jị ndị ọrụ ngo n'Imo steeti.

Nke a dị n'akwụkwọ agụgọ ọkaiwu ụlọakụ ndị a bụ Anthony Agbonlahor degaara ndị ntaakụkọ ụnyahụ n'Abuja.

Ụgbọelụ mara afọ n'ala na Moscow

Ụgbọelụ mara afọ n'ala na Moscow

Ebe foto si, AFP

N'ofesi, mmadụ iri anọ na otu anwụọla n'ụgbọelụ ndị Russia mara afọ n'ala na Moscow gbaa ọkụ.

Ebe ọtụtụ mmadụ sị ụzọ arụrụ maka ihe mberede gbapụta, ụmụaka abụọ na onye ọrụ ụgbọelụ ahụ sọ na ndị nwụrụ awụ.

Chelsea anyụọ Watford Ịkpakwụ

Chelsea anyụọ Watford Ịkpakwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chelsea anyụọ Watford Ịkpakwụ

N'egwuruegwu, Chelsea jị ọkpụ atọ nyụọ Watford ịkpakwụ n'asọmpị Premier League ụnyahụ.

N'otu aka ahụ, Huddersfield na Man. U ji otu ọkpụ gbaa onwe ha onye lawa onye lawa,ebe Arsenal na Brighton jikwa otu ọkpụ otu ọkpụ merie onwe ha.

Gee nkeji Igbo ebe a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị