Zainab Aliyu: Atọghapụla nwata nwaanyị ejichiri na Sawudi Arabia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ bụ onye odeakwụkwọ mịnịstrị na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Sulaimana Mustapha kwuru nke a.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, a na-atụ anya na gọọomentị mba ahụ ga atọghapụ onye ọzọ eboro ya bụ ebubo bụ Ibrahim Abubakir.

Cheta na anwụchiri Zainab na mba Sawudi Arabia maka ebubo na ọ tụrụ mgbere ọgwụike na mba ahụ.

Onye enyemaka pụrụiche n'ihe gbasara mmekọ Naịjirịa na mba ndị ọzọ bụ Abike Dabiri tinyere ọnụ n'okwu a.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ mekwara ngagharịwe gbasara ọnọdụ Zainab Aliyu iji gosi na ha kwụ ya n'azụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: