Governor Umahi enyela ndị ntoroọbịa iwu banyere ndị China a tọọrọ n'Ebonyi

Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ David Umahi enyeela ndị ntoroọbịa obodo ebe atọrọ ndị mba Chaịna abụọ iwu ka ha kwuo ihe ha maara maka ntọrọ ndị a ma ọ bụghị ya a ga-enyocha ha niile.

Gọvanọ Umahi nyere ndị ntoroọbịa bi n'agbata obodo Ohaozara na Ivo abalị abụọ ime nke a ma ọbụghị ya a ga-eji ndị uweojii bịa nyocha ha niile.

Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Emmanuel Uzo gwara BBC Igbo na gọvanọ Umahi gbarụrụ ihe n'ihi ntọrọ a tọọrọ ndị Chaịna na-arụrụ gọọmentị ya ọrụ.

O kwuru na gọvanọ Umahi nọ n'Abuja mgbe ihe a mere mana o nyere onye kọmshịọna ndị uweojii iwu ka ọ hụ na-achọpụtara ndị aka ha dị na ntọrọ.

Uzo kwuru na nke a bụ mbụ ụdị ihe a na-eme n'Ebonyi Steeti nke bụ kwa ezigbo ihe nwute nyee gọọmentị Ebonyi Steeti.

Mgbe BBC Igbo jụrụ ya ihe mere ndị a na-arụrụ gọọmentị Ebonyi Steeti ọrụ enweghi ndị nchekwa agbakwụnyere ha, o kwuru na ndị a nwere ndị ọrụ nchekwa na-arụrụ ha ọrụ.

Mana Loveth Oda bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steeti kọwara na ndị mba Chaịna abụọ ndị ntọ tọọrọ enwghi ndị ọrụ nchekwa ọbụla ha ji na-arụ ọrụ.

Ndị oji egbe kpuchiri ihe n'ihu bịara n'ụbọchị 24 ọnwa Eprelụ dịka o ji ọkara gafee n'elekere atọ nke ehihie ma tọọrọ ndị mba Chaịna abụọ ndị a.

Loveth gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ a a kpọrọ, Sun Zhixin na Wang Quing bụ ndị ọrụ ụlọọrụ mba Chaịna bụ Tongyi na-arụ ụzọ n'agbata obi obodo Ohaozara na Ivo dị n'Ebonyi Steeti.

O kwuru na ndị a nọ na-arụ ọrụ n'etiti ụzọ ebe oke ọhịa gbara gburugburu mana ha ejighi ndị ọrụ nchekwa ga-echekwa ha na ndị ọrụ ha.

Loveth gara n'ihu kwuo na onweghi mgbe ndị ụlọọrụ a bịara kpọtụrụ ndị uweojii maka ichekwa ha n'ebe ha na-arụ ọrụ.

O kwuru na ndị uweojii amaghị na ndị dị etu a na-arụ ọrụ n'okporoụzọ ahụ rue oge ihe a mere ka ha matara.

Loveth kwuru na onye nchịkọta ndị ụlọorụ a gwara Kọmshịọna ndị uweojii n'Ebonyi na ha arụọla ọrụ n'ebe ahụ n'ime ọnwa ise na-enweghi nsogbu ọbụla.

Loveth kwuru na mbọ niile ndị uweojii gbara ịchọpụta ndị a n'ụbọchị ahụ amịtaghị mkpụrụ kama na nyocha na-aga n'ihu iji hụ na-akpọlatara ha n'udo.

Ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ arịrịọ ka ha na-akpọtụrụ ndị uwojii oge ọbụla ha hụtara onwe ha n'ebe na-adịghị mma ọ bụ na-enweghi nchekwa zuruoke.

Akukọ ga-amasị gị: