Lee ụfọdụ ihe na-atakasị ntutu ụmụnwaanyị ojii

Ịkpa ịsị, ite isi ncha(Relaxer) na ịkwanye ntutu rọba (weave-on) emeela ka ntutu nwaanyị a bụ onye mba Sawụt Afrịka dapụsia.

Bandile (abụghị ezigbo aha ya) kwuru na mgbe ọbụla ọ tọpụrụ isi o bu, o tee ya ncha isi, kwanye ya ọzọ.

Ihe o kwuru bụ: "O nweghị mgbe m ji ebu ezigbo ntutu m."

Ugbua o nwere ọrịa a kpọrọ "Traction Alopecia" nke ọ chọpụtara na o nwere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị.

Mana ọ bụghị sọsọ ya na-arịa ọrịa na mba Sawụt Afrịka.

Nchọpụta e mere gosiri na ọkara atọ n'ime ụmụnwaanyị Afrịka na-arịa ya bụ ọrịa 'Alopecia.'

Ihe ruru pasentị 48 n'ime ụmụnwaanyị puku isii a jụrụ ajụjụ kwuru na ha agagbigala ya bụ ọrịa ntutu isi.

Okwu ụgha gbasara ezigbo ntutu mmadụ

Bandile na-ebo nsogbu ya okwu ụgha na-ewu nke kwuru na ịkwanye ntutu rọba na ịkpa ya akpa na-enye aka ime ya ka o too.

"Ihe anyị nụrụ mgbe anyị na-eto eto bụ na ntutu a kwanyere ka dị mfe ịhazi karịa ezigbo ntutu anyị"

Ụfọdụ nyocha na-ekwu na ụmụnwaanyị na-emefu ihe ruru ijeri dọlla isii na ntutu nkwanye kwa afọ.

Susan Magai nwere ụlọọrụ ebe a na-eme isi tinyere ọnụ na ya bụ okwu:

"Anyị na-agwa ndị na-abịa ịkpa isi ebe a ha ebukarịla isi ha gafee izuụka abụọ"

O kwuru na ụfọdụ mmadụ na-ebu nke ha rue ọnwa atọ nke na-eme ka ntutu ha bido ịdapụ.

Ụlọọrụ ya na-enye ọgwụgwọ maka ndị ntutu ha na-adapụ.

"Anyị ji mmanụ akụoyibo eme ya bụ ọgwụgwọ ga-eme ka ntutu mmadụ tochie"

Ntụtụ m dapụrụ mgbe m mụchara nwa

"Ị mụ nwa na oke nsogbu na-eso eme ka ntutu nwaanyị dapụ"

Okwu a si n'ọnụ Jumoke Koso-Thomas bụ dọkịta na mba Briten ma bụrụkwa ọkachamara n'ihe gbasara ntụtụ isi.

Boitumelo Monyaki kwuru sị: "A chọpụtara m na n'ezinaụlọ m, ụmụ nwaanyị mụchaa nwa, ntutu ha ebido ịdapụ."

"Nabata onye Afrịka ịbụ"

Bandile kwenyere na ụmụagbọghọbịa na ụmụntakịrị kwesiri i chegharị etu ha si ebu ntutu isi ha.

"Anyị kwesiri ị na-agwa ha emebila ntutu gị, etela ya ncha isi, nye ya ohere ikutu ume."

O kwuru na nke a bụ ndụmọdụ ga-ebiri oku n'oge adịghị anya dịka ndị mmadụ na-amụta ibu ntutu isi ha etu chi si kee ya.