Gombe accident: Ụgbọala akugbuola ụmụaka Boys' Brigade iri na-eme ngagharị 'Easter'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ anyi ji mere ọji ụtụtụ

Ụmụ Boys' Brigade na Gombe

Ihe mberede okporoúzó

Ebe foto si, AFP

Ụgbọala akugbuola ụmụaka Boy's Brigade mmadụ iri dịka ha na-eme eme ngagharị 'Easter',ebe mmadụ iri atọ merụru ahụ na Gombe steeti dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe steeti bụ Mary Malum si gwaa BBC Igbo.

Ụmụaka ndị a sị St Peter's Anglican Church nakwa Bamusa nọ Ụlọọgwụ Gombe Specialist Hospital ugbua a na-anata ọgwụgwọ.

Igbo na Yoruba bụ Nwanne

Oba Adeyeye Ogunwusi

Ebe foto si, Ooni's Palace

Nkọwa foto, Ooni nke Ife Oba Adeyeye Ogunwusi

Ooni nke Ife, Oba Adeyeye Ogunwusi ekwusiela ike na ndị Yoroba na Igbo bụ ụmụnwanne sị otu afọ nke bụ na o nweghị nkesa.

Oba Ogunwusi onye kwuru nke a oge ọ nabatara Onyeisi Ohaneze ndị Igbo Lagos bụ Solomon Ogbonna n'obi gwara Ndịgbo ha wụsa ahụ na Legọs na "uyo bụ uyo maa gị".

Ogbunigwe Sri Lanka

Sri Lanka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-etị na-ebe na Sri Lanka

N'ofesi, ọnụọgụgụ ndị mmadụ nwụrụ n'ogbunikwe Sri Lanka achụwala narị atọ ugbua.

Agbanyeghị na o nwebeghị otu kwetara n' aka ha dị na ya, gọọmentị obodo ahụ na-arụjere ndị ajo otu ọhụrụ a kpọrọ, National Thowheed Jamath dịka ndị nwere ike ịkpa ya bụ agwa ọjọọ.

Chelsea na Burnely ga-akwata tata

Chelsea na Burnley

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuruegwu,

dịka ndị otu egwu bọọlụ dị iche iche na-achịpụ ya n' asọmpị Champions League, ndị Chelsea na Burnley na-eke nkwụcha ikwakọrịta mpi n' asọmpi Premier League tata.

Ya bụ asọmpi ga-ebiri ọkụ na elekere asatọ nke abalịa ga-eme ka ndị Chelsea wụgoro na ogogo nke atọ ma ha merie.

Gee nkeji Igbo

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Abụm onye Naijirịa - Atiku

Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Onye zọrọ ọchịchi onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar akọwara ihe mere ya jiri tozuo ịzọ ọkwa dịka onyeisiala Naijirịa.

Na nkọwa Atiku, atụmatụ pati no na ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) wepụtara na ya abụghị onye Naịjirịa adabaghi manacha makana nne na nna ya bu ndị Naịjirịa kpọmkwem.

Dịka, amụrụ ha na Naịjirịa.

Atiku si na nne ya bu onye Dutse nke di na Jigawa Steeti, ebe nna ya bụ onye Wumo di na Sokoto steeti.

Aha onyonyo, Volodymyr Zelensky na ndi nkwado ya n'enwe anụrị maka mmerị ya

Onye ọkpa ọchi buzi onyeisiala Ukraine

Ọkwa egwuregwu egwuregwu ka ojiri sonye na achụmta vootu ịbụrụ onye isiala Ukraine

Mana Volodymyr Zelensky abụrụla onyeisiala n'ezie ka ndị Ukraine si na etu osi mee ka onyeisiala n'ihe onyonyo masiri ha, ya bịa mee ya n'ezie.

Woman mourning the death of a relative

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụlọụka atọ so n'ebe awakporo

Mmadụ 290 anwụọla na mwakpo Sri Lanka

Ọnụ ọgụgu ndị nwụrụ na mwakpo eji ogbuniwe mee n'ulọ ụka nakwa ụlọ ezumike eruola mmadụ nara abụo na iri itoolu, ebe ihe karịrị mmadụ nari ise merụrụ ahụ.

Amabeghi onye kpara ike a, mana aka ndị nchekwa ji mmadu iri abuo na anọ a na-enyocha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'egwuregwu

Onye ọgba ọsọ Divine Oduduru tụrụ ugo na asọmpị ọsọ akpọrọ Michael Johnson Invitational agbara ụbọchị Satọde ụbọchi nke iri abuọ nke ọnwa Apreelu, 2019.

Oduduru ji nkeji itoolu na ọma ji merie ma chabịe ọkacha gba Francis Obikwelu gbatara n'afọ 1999.

Gee Nkeji ndi ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe ọnyonyo nke taa:

Aha onyonyo, Killiwee Nwachukwu