Facebook, Instagram outage: Facebook nyụrụ ka ọkụ taa

Akụkọ dị n'elu taa

Facebook Nyụrụ ka ọkụ taa

Ụnụ achọpụtakwara e, na Facebook, Instagram na messinger nyụrụ ka ọkụ ihe ruru awa atọ taa.

Nsogbu a malitere ihe dị ka elekere iri na otu nke ụtụtụ a mezikwara n'elekara abụọ nke ehihie.

Ebe ndị ọrụ ha ekwughị ihe gbatara nke a, ha rịrọ mgbaghara.

Mmechi keke n'Abịa

Akụkọ ruru BBC Igbo nti site Abịa steetị na-akọwa na ndị njem tọọrọ n'ụzọ n'abalị Satọde maka mechi nwamgbenta gọọmentị mechiri keke na steeti ahụ.

Kọmịshọna mgbasa ozi bụ John Okeiyi kwuru na ụnyaahụ bụ ụbọchị mbụ ebidoro ya bụ amụma nke gọọmentị tụrụ anya na ọ ga-ebelata ohi na mpụ na steeti ahụ.

Nwaagbọghọ agbagburu na Legọs

Na steeti Legọs, onye uweojii agbarala nwaagbọghọbịa tụọ ma merukwa nwa nwoke ya na ya yi ahụ n'Ajagunle.

Onyeisi ndị uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu enyela iwu ka anwụchikọ ndị otu ha gburu Ada Ifeanyi na merukwa Emma Akomafuwa ahụ.

Manchester City ji ọkpụ goolu atọ charaacha nyụọ ndị Cyrstal Palace ịkpakwụ taa n'Asọmpị premier League ebe Chrystal Palace ji otu ọkpụ gosi na ọ bụ nwoke na ibe ya lụrụ ya bụ ọgụ.

Gee Nkeji Igbo ebe a

Ihe Atiku gwara APC

Onye zọrọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar asaala atamụmatụ patị APC weputara n'ụloikpe nke n'akọwa na site n'ebe amụru ya, onweghi ikike ịzọ ọchịchị onyeisiala na Naịjirịa.

Atiku si n'okwu a enweghi isi nke oji nwee ọdụ, ka APC chọba ihe ọzọ ha ga-ekwu.

Ụfọdụ ụmụ Chibok ka nọkwa n'aka Boko Haram

Taa mere ya afọ ise ndị omekome Boko Haram tọọrọ ụmụakwụkwọ na gọọmentị Girls Secondary School nke dị na Chibok, Borno steeti.

ụbú n'abalị ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa Apreelụ 2014 ka tọọrọ ụmụakwụkwọ karịrị narị abụọ n'ụlọ akwụwkọ ha.

Kamgbe ahụ, enwetala otu narị na asaa n'ime ha mana ihe karịrị narị ka na-efu efu.

N'ofesi,

Pati anọghị n'ọchịchị na mba Amerịka enyela gọọmentị onyeisiala Donald Trump ruo ụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa Epreelu ka o nye ha akwụkwọ oji kwụọ ụtụ isi.

Pati Demokrat nyebụrụ Trump ubọchị nke iri nke ọnwa a ka ome ihe ha kwuru mana ọgbajụrụ ha.

N'egwuregwu,

Manchester United pụtara ka nwachinemere ụnyaahụ mgbe ha zutere West Ham n'ọgbọ egwuregwu Old Traford.

Ọ bu penariti abụọ otu ugo ha bụ Pogba jiri mee ihe nyere Manu ọnụ ha ga-eji kwuo okwu ka agbachara ya bụ asọmpị.

Gụọ nke a n'uju ebe a: Man Utd alaala na nta

Gee njeki ndị a ebe a:

Lee ihe nkiri anyi nke taa: