You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sam Mbakwe International Cargo Airport: Ụgbọelu amalitela ifebata ma fepụ n'ọdọụgbọelu a- Ndi uweojii
Ụgbọelu amalitela ifebata ma fepụ n'ọdọụgbọelu Owerri dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Orlando Ikeokwu
Mgbe anyị nụrụ akụkọ a na mbụ, e kwuru na ọkụ na-agba n'ọdọụgboelu Sam Mbakwe dị n'Owere n'ehihie tata bụ Monde.
Mana ndị ọrụ gbatagbata n'odoụgbọelu mechara menyụọ ọkụ ahụ, dịka onye ntaakụkọ anyị bụ Paul Chukwu onye gbara ụgbọelu si Legọs gawa Owere n'ehihie a kwuru.
A mabeghị ihe butere ọkụ ahụ nke a na-enwe akụkọ ndị merụrụ ahụ mana ọkụ ahụ gbapịara ọtụtụ ihe tupu e menyụọ ya.
Ọdachie ahụ meburu ka e dugharia nfeda ụlọelu ndị kwesiburu ifeda ebe ahụ, gaa ọdọugboelu Pọtakọt.
Dịka a na-ekwu, o nweghị onye a nụrụ nwụrụ n'ihe mberede ọdọụgbọelu ahụ.
Anyi ga-ewetere unu akụkọ ka o si eme.