You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Pizza: Ihe asaa na-eme ihere na Naijiria na-esi mba ofesi atụbata
Mịnịsta na-ahụ maka orugbo bụ Audu ogbeh atụọla arịrị maka ego Naijiria na-emefu na ịtụbata nri na Naijiria.
Ogbe onye kwuru nke oge ọ na-akọwara ndị omeiwu bọjeti ngalaba ya kwuru na a na-atụbata ọtụtụ ihe a na-emepụta na Naijiria gụnyere achịcha bekee a kpọrọ 'Pizza.'
Dịka onyeisi ụlọ ọmụmụ ihe gbasara ibupụ ngwaahịa nke a kpọrọ 'Institiute of Export Operations na Management' bụ Udofia Ofonasaha, siri kọwara BBC Igbo , ọ bụghị naanị Pizza, ụmụ mpịapịa ihe ụmụ Naijiria na-atụbata ekwesịghị gụnyere:
1. Nghụeze:
Naijiria nwere oke ọhịa nwekwa osisi e nwere ike iji mepụta nghụeze ebe ọ dị ukwu dịka ọrụ mmepụta nghụeze abụghị ihe rijuru afọ nke na e ji nka pụrụ iche eme ya.
2. Tomato mkpọ
Tomato na-amị n'uju na Naijiria nke o nwere oge ọ na-ejupụta ma retọọ n'ihi enweghị usoro ichekwa ya.
Mana Naijiria na-atụbata tomato mkpọ kama ịchọ ụzọ idokwa nke na-amị n'ala Naijiria.
Ụfọdụ ụlọọrụ na-echekwa Tọmatọ site ịgba tọmatọ na-amị na Naijiria na mkpọ emechiela n'ihi iheisi ike na-emetụta ụlọrụ na-arụpụta ngwahịa.
3. Udara bekee
Ọ na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya na a na-atụbata na ihe dịka ụdara bekee nke a kpọrọ 'apple' na Bekee nakwa mkpụrụosisi ndị ọzọ dịka unere, akwụolu na ụsụke.
4. Akị bekee
Akị bekee dị n'ọtụtụ ebe na Naijiria mana ụfọdụ ndị Naijiria na-esi mba Ghana na-atụbata ya.
5. Igwe na-enye ọkụ na akọrọngwa igwe e ji ebi ụlọ ochie
Ọtụtụ igwe na-enye ọkụ a na-atụbata na Naijiria bụ ndị ndị mba enweghị ike ịnabata n'ihi na ha ezugh ị oke.
Ọtụtụ akpakara igwe ochie bụ ihe e ji enyere ndụ aka dị iche iche dịka igbe onyonyo, igwe okwu radio, kọmpụta na igwe ndị ọzọ karala nka bụ ihe ụmụ Naijiria na-atụbata.
Nke a bụ na agbanyeghị atụmuche ndị ọrụ nchekwa gburugburu na o nwere ike ibute nsogbu na gburugburu.
6. Achịcha
Ụfọdụ ọdọ ahịa na Naijiria na-atụbata achịcha mba France n'ala Naijiria n'agbanyeghị na Naijiria nwere ụlọ ebe a na-esi achịcha ọtụtụ.
7. Ozu ọkụkọ
A na-atụbata ozu ọkụkọ na-agbanyeghị na Naijiria nwere ike izulite ọkụkọ ga-ezuru ụmụ Naijiria oriri.
Ihe oke ịtụbata ihe ndị a na-ebute
Na nkọwa ya, Udofia tara ma gọọmentị ma ndị ojieegoachụego na ọ bụ ha nyụrụ ihe na-esi dịka o siri gbasa ịtụbata ihe ndị ekwesịghị ekwesị na Naijiria.
Udofia nye ọkachamara na ntụbata na mbupụ ahịa kwuru na:
1. Ọ na-akụtu ọnụ Naira n'ahịa mba ụwa.
2. O na-ebute enweghị ọrụ.