You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kaduna state: Gịnị ka ndị ntọ na-achọ n'ahụ ndị Fada?
Ndị oji egbe egbu atọrọla otu Fada akpọrọ John Bako Shekwolo n'obodo Ankuwa dị n'okpuruọchịchị Kachir na Kaduna.
Ọnụ na-ekwuichitere ndị uweojii bụ Yakụbụ Sabo na Kaduna steeti kwuru na ndị ntọ gara na be Fada Shekwolo na-emeghị mkpọtụ ọ bụla ga-atọrọ ya.
Sabo kwuru na ozugbo ihe a mechara ,o zipụrụ ndị otu ya ha chọwa n'akụkụ obodo ahụ niile ka ha mata ebe ndị omekome a kpọ Fada Shekwolo gawa wee gbapụta ya.
O kwuru na etu ọ dị ugbua na ha ka na-enyocha ma na-arịọ ndị mmadụ nwereike itụnyere ha azụ gbasara ebe ọ bụ ha bịa n'ụlọọrụ ha gwa ha.
Dịka ụlọọrụ mgbaozi punch si depụta, Fada Shekwolo bụ ụkọchukwu "St. Theresa's Catholic church" dị n'obodo Ankuwa
Ihe ka na-agbagọjụ ndị mmadụ anya bụ etu esi atọzị ndị ụkọchukwu agbanyeghị na ha bụ ndị na-enyere ndị mmadụ aka.