AFCON 2019: Mba Egypt awuchiela Naịjirịa maka asọmpi ha na Super Eagles ga-agba na Tuzde

N'Egwuregwu,

Ndị Super Eagles

Ebe foto si, Getty Images

Otu Egwuregwu boọlụ mba Egypt awuchiela Naịjirịa maka asọmpi nkwado iko AFCON nke afọ 2019.

Ha ga-ezute onwe ha ụbọchị Tuzde na-abịanụ n'ọgbọ egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba.

Akụkọ ntuliaka mmeju

Ortom

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ortom achiala Benue ruo afọ anọ tuu omerikwa ọzọ

Inec akpọpụtala gọvanọ Samuel Ortom dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ na Benue steeti.

O nwetere vootu ruru narị puku anọ na ụma ebe onye so ya n'azụ bụ onye otu APC, Emmanuel Jime nwetere vootu narị puku atọ n'ụma ka chịkọtachara mpụtara ntụliaka e mere na mbụ nakwa nke mmeju.

Inec gakwara n'ihu kwuo na onye ụlọọrụ ha bụ ọkammụta Tuluen ndị omekome gbara egbe mgbe o na-ebuga mpụtara ntuliaka mmeju ebe a ga-agụkọ ya nọ n'ụlọ ọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

N'akukọ ọzọ,

Bishop Adedeji n'ime ụlọụka

Bishop na chịkọta ndị ụka Anglican na Lagos bụ James Olushola Odedeji akatọla etu ndị ntọ si gbuo Father Clement Ugwu nke ụka Katọliki.

O kwuru na nke a gosiri na onweghị olileanya dị n'ebe ndị nchekwa Naịjirịa nọ nke pụtara na ndị ọchịchị Naịjirịa nọ na gbaharịa gbasara nchekwa.

N'ofesi

Theresa May

Ebe foto si, Getty Images

Gịnị na-eme n'ụlọomeiwu mba UK?

Akụkọ na-ekwu na ndị ụlọomeiwu na mba ahụ na-akwado ịchọta onye ọzọ ga-anọchite anya praim minister Theresa May maka okwu gbasara Brexit.

Nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo, Igbo Language: Gịnị bụ 'Umbrella' n'asụsụ Igbo?