You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Presidential Election 2019: Ihe anọ mere Atiku ji gbajọọ mmeri Buhari
Atiku Abubakar bụ onye zọrọ ochịchị n'okpuru pati PDP ekwuola na ya anabataghị mmeri Buhari meriri ya.
Atiku sị na ntuliaka bụ nke kachasi jọọ njọ kemgbe ya bidoro mewe ihe banyere ntuliaka ma sị ndị kwadoro ya nọsie ike.
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru:
1) Atiku sị na nrụrụaka banyere ntuliaka nke ukwuu, ma sịkwa na nrụrụaka dị ka ihe akpara akpa tupu emewe ha.
2) Agbachịrị ndị na-akwado ya ma gbachapụ ha n'ime ntuliaka etu ekwesighi kwesị.
3) Eji ọgbaghara banye ebe ndị na-akwado ya kachasị nke ndị nchekwa hụrụ ma gbaa nkịtị.
4) Yabụrụ na o meriri n'ụzọ ziri ezi, ọ ga-ekele onye meriri ya ma nye nkwado ịhụ na obodo Naịjirịa gara n'ihu nke ọma.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: