You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Presidential Election 2019: 'Ụzọ atọ azịza si zapụ ncheanwụ n'ụzọ oche onyeisiala'
Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ekwuola na ọ bụ Muhammadu Buhari bụ onye ga-achị Nigeria n'afọ anọ ga-abịa.
Mana okwu a ka bụ ihe na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua.
Atiku Abubakar bụ onye ya na Buhari zọrọ ọchịchị onyeisiala, kwuru na ya anabataghi ihe Inec kwuru.
Ka o sila dị, Immanuel James Ibe-Anyanwu bụ onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere obodo, gwara BBC na n'agbanyeghị na onyeisiala Muhammadu Buhari emeriela, ihe bụ isiokwu ugbua bụ ụzọ o si merie.
Lee ihe Ibe-Anyanwu sị mere Buhari jiri merie Atiku:
1) Atiku họtara onye Igbo ka ọ bụrụ osote ya:
Ibe-Anyanwu sị na otu ihe mere ka Atiku daa bụ makana onye ọ họtara ka ọ bụrụ osote ya bụ Peter Obi bụ onye Igbo.
Ọ sị, "Ọ bụrụ na ọ bụghị onye Igbo bụ osote ya, Buhari agaghị emerinwu ya."
Nkọwa ya bụ na ọ bụ achọghị ndị Igbo n'ọchịchi mere ndị mmadụ ejighi tinyere Atiku.
2) Ndị mmadụ apụtaghị ịtụ vootu ka okwesịrị.
"Ndị natara akwụkwọ ntuliaka dị nde iri asaa na abụọ na ụma, mana ndị tụrụ vootu bụ naanị nde iri abụọ na asatọ na ụma," Ibe-Anyanwu kwuru.
Ma tinyekwa na ya bụ ihe na-agbawa obi dịka ndị Naịjirịa ekwesịghi i na-eme etu a.
3) Ntuliaka a agaghi nke ọma ma:
Ibe-Anyanwu sị na ihe ọzọ bụ na ntuliaka a nwere ọtụtụ ọghọm, dịka amaliteghi n'ọge, mpụ na nrụrụaka mere n'ụfọdụ ebe, nakwa ọgbaghara na ogbugbu mmadụ, so n'ihe mere mmeri jiri raa Atiku ahụ.
Ibe-Anywanwu gara n'ihu sị na n'agbanyeghi na ndị mmadụ chọrọ ka ntuliaka nke a gaa ọfụma karịa nke 2015, ọ bụghi ihe a ka a hụrụ, n'uche ya.
Akụkọ ga-amasị gị