You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe amabeghị ihe ọ bụ gbara n'Enugwu n'abali
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ogbunigwe amaghị ndị tụnyere ya gbara n'Otigba Junction dị n'Enugwu.
Onweghị onye nwụrụ n'ọdachi ahụ nke mere n'ime ụgbọala bu ndị mmadụ na nso Otigba ka o ji ihe dịka nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke abalị.
Mana ndị nọ n'ime ụgbọala ahụ merụrụ ahụ.
Oge onye ntaakụkọ BBC rutere ebe ahụ, ọ hụrụ ka akwa na ngwogwo fesasịrị ebe ahụ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ha nụrụ ka ihe dara oke ụda.
Ka ọ dị ugbua, ndị ngalaba na-ahụ maka ogbunigwe erutela ebe ahụ inyocha ihe gbara ma ọ bụ ogbunigwe ma ọ bụghị ya.
Akụkọ ka na-abịa
Sexual abuses in Catholic Church: 'Taa Bishọp ọbụla gbuchiri fada na-akpara akwụ ahụhụ'
Cardinal Blase Cupich nke Chicago dị n'Amerịka akpọọla oku ka ewepụta iwu ọhụrụ ga na-ata ndị Bishọp ahụhụ maka ikpuchi ndị ụkọchụkwu na-akpa arụ n'ụka Katọlik.
Cupich kpọrọ oku a n'ọgbakọ Popu Francis kpọrọ na Vatican City banyere mkpesa metụtara mmetọ ndị ụkọchụkwụ ụfọdụ na-emetọ ndị chiri sista nakwa ụmụaka nke a madoro akwa ọtụtụ afọ gara aga.
Achọghị m ime Naijiria mba na-ekpe ụka Alakụba
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari agọọla agụgọ sị na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ọ chọrọ ime Naijiria obodo na-ekpe ụka Alakụbabụ ụgha mabụrụkwa aka ọrụ ndị arụrụala chọrọ ibute nkewa. O kwuru na ya kwudosiri ike na iwu ala Naijiria.
N'aka nke ọzọ, Buhari n'ozi ọ gbasara n'Fraide n'ihe onyonyo gbara ụmụ Naijiria ume ka ha pụta n'igwe tụnyere onye masiri ha na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-eme ụbọchị Satode.
Ndi uweojii dị njikere maka ntuliaka -FPPRO
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mbah ekwuola na ndị uweojii ezipụrụ ọrụ nọna makụkụ dị iche iche na Naijiria adịla njikere ịhụ na udo chịrị dịka a na-eme ntuliaka Satode.
Ọ dọrọ aka na nti ka ndị agbaro na omekome gbara ọgwụ ha nụọ n'ihi na ndị ọrụ ha ga-anyụ onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaghara ebe a na-eme ntuliaka ịkpakwụ.
Ụkwụ atọla Chelsea n'ama
N'egwuregwu, Fifa amachiela otu egwu bọọlụ Chelsea ịzụ ndị egwu were ruo afọ 2020 maka ịda iwu ịzụ ndị egwu bọọlụ na-etorughị afọ iri na asatọ.eto.