Pre-wedding Photo: O nwere ihe dị njọ n'atụmaatụ a?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọ bụrụ na ịnụbeghị maọbụ ịhụbeghị atụmaatụ akpọrọ 'pre-wedding' foto, ị mara na ị so na ndị agbara ochie.

Ụfọdụ na-eri nsusu, ụfọdụ anọdụ n'ụlọ mposi, ụfọdụ a na-emetu onwe ha aka n'ahụ maọbụ gbara ọtọ na Pre-wedding foto anyị na-ahụ ugbua.

Akụkọ pụtara na mba Ghana n'oge gara aga kwuru na otu ụlọụka ọgbara ọhụrụ machiri "Pre-wedding" foto maka etu ọtụtụ ndị chọrọ ịlụ onwe ha si emetu onwe ha aka.

Nke a bụ Pre-wedding e mere n'ime mmiri.

Mana o nwere ihe dị njọ na Pre-wedding foto?

Onye na-ese foto aha ya bụ Otto Udofia gwara BBC Igbo na o nweghị ihe dị njọ na ya bu atụmatụ makana ha na-eji ya egosipụta akaọrụ ndị osee foto.

Mana ụkọchukwu Samson Nzekwe kwuru na foto a na-ese tupu agba enweghị ihe ọjọ dị na ya ma ọ bụrụ na nwoke emeela ego n'isi nwata nwagbọghọ ahụ ọ chọrọ ịlụ.

Kama ọ nyere ndụmọdụ na ịpịkasị aka n'ahụ ha ma esewe ya bụ foto adịchaghị mma makana ụfọdụ ndị okwukwe ha esighị ike nwereike ịghọtahie ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: