Obasanjo: Ihe m jiri gbaghara Atiku

Okwu juru Olusegun Obasanjo n'ọnụ mgbe ya na onye ntaakụkọ BBC Yoruba zutere.

Na mkparịtaụka a, Obasanjo kwuru maka onyeisiala Muhammadu Buhari na pati ya bụ APC, ma bo ha ebubo mpụ na nrụrụaka.

Ọ sị; "I nwere ike zuru Naịjirịa nafee ma I bụrụ na ị bụ onye APC. Ị bụrụ onye PDP, agbaa gị njọ gị n'ihu."

Obasanjo kwukwara maka onye bụbu osote ya bụ Atiku Abubakar, bụ onye ọ sị na ya gbaghara njọ makana ya chọrọ ka Chukwu gbaghara njọ nke ya.

Obasanjo gosiri na mwakpo ndị agha Naịjirịa wakporo obodo Odi bụ ebe mmadụ 2500 nwụrụ abụghị ihe na-amapụ ya obi.