You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ị maara ilu Igbo nke ọma?
Zaa ajụjụ ndị a ka a mara onye bụ onye taa.
Akụkọ ga-amasị gị:
Nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo na Abia Steeti
Ọ ga-akpọtụ n'Owerri n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri na asatọ nke Jenụwarị bụ mgbe oge nrụrịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo
Nrụrịtaụka a bụ nke ụlọọrụ mgbasa ozi BBC Igbo na-ahazi ga-enye ndị a ohere ịkọwara ndị Imo Steeti ọrụ ha ga-arụ ma ha baa n'ọchịchị.
Nke a ga-amalite n'elekere abụọ nke ehihie, a ga-agbasa ya n'igwe redio nakwa n'akara Facebook na Instagram bụ BBC News Igbo.
Ndị ga-eso na nrụrịtaụka bụ Uche Nwosu nke pati AA, Hope Uzodinma nke pati APC, Chukwuemeka Ihedioha nke PDP na Ifeanyi Araraume nke pati APGA.
Nrụrịtaụka nke Abia Steeti ga-adị n'ụbọchị Fraịde bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị.
Nrụrịtaụka a ga-amalite n'elekere mbụ nke ehihie, a ga-agbasa ya n'igwe redio nakwa n'akara Facebook na Instagram bụ BBC News Igbo.
Ọ ga-abụ n'etiti Uche Ogah nke APC, Okezie Ikpeazu nke PDP, Alex Otti nke APGA na Blessing Nwagba nke SDP.