Asset Declaration: Ndị Naijiria welitere isi gọọmenti etiti kpụpụrụla n'ụlọikpe CCT

Mkpụpụ gọọmentị etiti kpụpụrụ ọkaikpe ukwu Naiijiria bụ ọkaikpe Walter Nkanu Ọnnoghen, ka na-akpọtụ.

Cheta na a kpụpụrụ ya n'ụlọikpe Code of Conduct Tribunal, maka ebubo na o kwuputachaghị ngwongwo nakwa akụ niile o nwere tupu e mee ya nnukwu ọkaikpe.

BBC Igbo mere nchọpụta maka mmadụ atọ ọzọ gbara elu na Naijiria bụkwa ndị a kpụpụrụ n'ụlọikpe a.

Bukola Saraki

Onyeisi oche ụlọnzukọ Senate bụ Bukola Saraki wụchiri n'ụlọikpe nke Code of Conduct, n'ụbọchị iri abụọ na abụọ ọnwa Septemba, 2015, iji zara ọnụ ya maka ebubo eboro ya na o gosipụtachaghị ihe niile o nwere mgbe ọ bụụrụ Gọvanọ na-achị steeti Kwara.

E bokwara ya ebubo na onwere ego dị iche iche n'ụlọ ọbaego dị na mba ofesi.

Mana ụlọikpe ekpechaa ọgwụ nke Naijiria nọọrọ n'ụbọchị ise nke ọnwa Julai, 2018, kachapụ ebubo niile ndị a, ma tọhapụ Saraki.

Ike Ekweremadu

N'otu aka ahụ, ọchịchị etiti nọọrọ n'ụbọchị iri nke ọnwa Ọktoba, 2018, ma kpụpụ osote onyeisi ụlọnzukọ senate bụ Ike Ekweremadụ n'ụlọikpe CCT n'ihi ebubo na o kwupụtachaghị ngwongwo nakwa

akụnaụba niile o nwere dịka iwu siri dị.

Ihe ndị a gụnyere: ụlọ abụọ na mba UK, asatọ na mba Dubai, atọ na Florida, nakwa mba Amerịka.

Bola Ahmed Tinubu

Na-aka nke ọzọ, ọchịchị etiti nọọrọ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Septemba 2011, ma kpụpụ onye Gọvanọ chịbuuru steeti Legos bụ Bola Tinubu n'ụlọikpe CCT, n'ihi ebubo na o tinyere ego n'ụlọ ọbaego

dị na mba ofesi site n'afọ 1999 rue 2007.

Mana ụlọikpe a nọọrọ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Septemba, 2011, ma kachapụ akwụkwọ a a gbara megide Tinubu, kọwakwaa ya dịka nke nwere ntụpọ n'iwu.

Akụkọ ga-amasị gị: