You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: EFCC si na ha agaghị enye nrụrụaka ohere na 2019
EFCC na-enyocha ụlọakụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị
Ka a na-akwado ntuliaka nke 2019, ngalaba na-ahụ maka mpu na aghụghọ bụ EFCC na-enyocha ụlọakụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị maka ịchọpụta ndị na-enupu isi n'iwu ego nrụrụaka
Ndị agha na ndị uweojii kwara isi n'Aba ụnyaahụ
Anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na nsogbu bidoro mgbe ndị agha kparala onye uweojii aka ma chọ ịkpụba ya n'ụlọọrụ ha.
Ndị ntaakụkọ na-ekwu na mgbọ egbe gbụrụ mmadụ atọ n'ọgbaghara a ka ndị ọzọ ekwughị ole ha dị merụrụ ahụ.
Paul Manafort agaala mkpọrọ
Onye bụbụ onye nhazị ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala Amerịka Donlad Trump bụ Paul Manafort nọ na nga.
Nke a mere ka ọkaikpe na Washington DC kwuru na Manafort na-amaja ndi ga-agba akaebe n'ikpe ya.
Super Eagles na Kroeshịa na-akwado ịsụ mpi
Ọ bụ taa ka Naịjirịa ga-ebido njem ibute iko mbaụwa. Ndị Super Eagles ga-ezute Kroeshịa na-elekere asatọ nke abalị a.
Cheta na Ronaldo nke Portugal ritere goolu atọ n'asọmpị a na Spen gbara nhatanha.
Gee akụkọ anyị
Lee ihe nkiri anyị n'ụtụtụ a