Ihe asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka

Aha onyonyo, Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka

'Ọrịa abụghị naanị ihe na-emetụta ahụ anyị, e nwere ọrịa na-emetụta uche.

Mmadu ida mba n'obi na-abụkarị ihe na-akpata ikwụ ụdọ.

Nke a bụ ọnụ okwu ọkachamara n'ihe gbasara ahụ ike nke uche bụ Pamela Udoka.

O kwukwara na ọ dị mkpa ịleba anya na ụfọdụ ihe nwere ike ime ka mmadụ gbuo onwe ya.

Udoka gwara BBC Igbo ụzọ dị iche iche a ga-esi mara onye nwere ike ikwụ ụdọ, nakwa etu a ga-esi nyere ya aka.

Nwata nwoke na-ebe akwa

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ ịgbanwe akparamagwa ya na mberede

  • Onye ị mara kwụsị ime ụfọdụ ihe ọ na-emebu, bido kpawa agwa dị iche maọbụ n'ezighi ezi.

Ehighị ụra maọbụ ihi oke ụra

  • Mmadụ nọkata kwụsị ihi ụra maọbụ hifewe ụra oke ma ọ bụghị ọrụ kpatara ya.

Irife nri oke maọbụ ịkwụ agụụ

  • Onye dịbu na mbụ eri nri ọfụma nọkata kwụwa agụụ, maọbụ onye abụghị onye nri nọkata riwe oke nri.

Adịghịzị enwe mmasị n'ihe omume ndị na-akpalịbu mmasi gị

  • Enyi gị nwere ike bụrụ ya na-achọpụta uzọ ụnụ si enwe aṅụrị, anọkatazịa ekwute okwu egwuregwu, ọ daa jụụ.
Nwata nwoke na-ebe akwa

Ebe foto si, Getty Images

Onye enweghị ihe ọma ọ na-ahụ n'ọnọdụ ọbụla

  • Mmadụ nọkata kwụsị ịnwe olileanya, kwube ajọ okwu maọbụ nwebe mwute gbasara onwe ya.

Mmadụ ịnọkata chọba ịnọ naani ya oge niile

  • Enyi gị maọbụ agbataobi gị bido nọwa naanị ya oge niile, gbaa mbọ leta ya.

Ịkwa akwa n'enweghị ihe na-eti ya

  • Mmadụ ikwa akwa ma ọmaghị ihe kpatara ya nke ndị Bekee kpọrọ 'weeping spells'.
nwata nwaanyị na-ebe akwa

Ebe foto si, Getty Images

I nwere ike ịhụ otu n'ime ihe ndi a maọbụ ha niile.

Mana ka o sina dị, ṅaa ntị, na-elenyere nwanne gị anya.

Mgbe ị hụrụ ka mmadụ na-eme ihe ndị a, gaa onye ahụ nso, jiri okwu ọma were kasie ya obi.

Gwa ya na ihe ọma dikwanụ n'ụwa, ma gbaa ya ume ka o nwee ike gaa ụlọọgwụ hụ onye na-ahụ maka ahụike nke uche, n'ihi na naanị otu ụzọ ka a ga esi gwọọ ọrịa nke uche a.

Ọ bụ ma achọpụta ihe kpatara ịda mba n'obi, nke na-ebute ịkwụ ụdọ ka dọkịnta ga-esi were mara ngwọta ya.

Ịda mba n'obi nwere ike ime onye ọbụla, ya bụ na ị gaghị akọtọ onye ọ na-emetụta.

Kama were obioma kwalite ọnọdụ uche onye ahụ.

Akụkọ ga-amasị gi: