You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dino Melaye: Daalụnụ ndị Kogi maka ịkwụnyere m
Dino Melaye bụ Sinatọ na-anọchite anya ndị si ọdịda anyanwụ Kogi steeti ekperela ndị steeti ya nakwa ụmụ Naijiria niile ekpere ngọzị maka ịwado ya dịka ndị uweojii na-achọ ya ka ha nwụchie.
Nke a n'eme dịka akụkọ pụtara n'otu otu abụghị nke gọọmentị a kpọrọ 'Justice Helpline Foundation' kwuru na ha ga-akpụpụ ndị uweojii ụlọikpe ma ọ bụrụ na ha agwụsịghị iyija Melaye.
N'ụtụtụ Wenezde, Dino Melaye tiri mkpu n'igwe Twitter na-ekwu nana ndị uweojii na-achọ ịkụka ọnụụzọ ụlọ ya.
N'ihe nkiri o wepụtara ebe ọ nọ na-ekwu okwu ka onye na-agba izu, Melaye kwuru na 'ọ bụ Chineke usuniile nke ndị agha' ga-agbara ya ọgụ.
O kwuru na ọ bụghị ọsọ ka ya na-agba, kama na ọ bụ akọ na uche ka eji eme ihe.
Lee ihe ndị mmadụ sara ya n'akara Twitter:
@xtanburg kwuru ka Melaye kwupute mmehie ya ma were onwe ya nye na aka ndị uweojii.
@FemiOmotee gwara ya na ọ na-ekwuru onwe ya.
Mana @ApostleDavidOdi kwuru na ụmụ Naịjirịa na-ekiri ihe na-eme nakwa ha agaghị ekwe ka ihe iwu na-akwadoghị na-eme.
@dottee007 kwuru na ọ ma na ndị uweojii na-egbu oge makana Melaye bụ nwoke ma ihe onye na-eme.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: