Dino Melaye: Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ na 'ntọrị' onye omeiwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

"Dino Melaye bụzị onye a na-achọ achọ!" ihe a bụ ihe Omeiwu Ben Murray-Bruce dere n'akara ya na Twitter, ma kwuo na ọ bụ nwanne Melaye gwara ya.

Ọ kọwara na ndị ji ụgbọala Sienna nọchịrị ihu ụgbọala bu Melaye wee kpụrụ ya gbalaga.

Melaye kwesịrị ịza oku n'ụlọikpe dị na Kogi.

Mana, dịka a ma Melaye ka onye adịghị ata ntị ya ata, o mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ọ bụkwa eziokwu.

@Debabz sị na ọ dị ya ka ọ bụ ihe nkiri.

@IamNaibi sị na o nwekwara olileanya ikiri ya bụ ihe nkiri ma ọ pụta.

@luccavelli kwuru na akụkọ a nwere ka ọ dị.

@the_publicman jụrụ etu onye ndị nchekwa ya na ndị uweojii gbara onwe ha egbe ga-esi bụrụ onye ndị ji Sienna ga-anwụchi.

@ogundamisi na-ajụ na etu a ọ bụ naanị nwanne Melaye hụru mgbe "atọọrọ" ya, ọ ga-enyekwara uweojii aka mee nchọpụta?

Mana, enwekwara ndị kwenyere na ọ ga-abụ eziokwu na aka ji Melaye.

@Faithwachukwu jụrụ etu onye na-aga ụlọikpe ga-ahazi ntọrị onwe ya.

@kem_winnerz_A sị na enwere ike ọ bụrụ eziokwu makana Melaye "bụ onye a kpụ n'ọnụ site oge mbụ".

Ma ruo ugbua, onwebeghị onye ma nke bụ eziokwu maka "ntọrị" a.

Ndị uweojii na onwe ha sị ka ndị nwe Melaye bịa gwa ha nke ha ma maka ihe a mere, maka onwebeghị ihe ha nụrụ maka ya.

Cheta na Dino Melaye nwere azịza n'ụlọikpe dị na Kogi maka okwu metụtara ibu egbe na aka ndi ntọrị tụrụ ya.