PDP Aba Townhall meeting: Ekwenyere m na 'Restructuring - Atiku

Ebe foto si, Twitter/Obi/Secondus/Atiku
Atiku Abubakar na Peter Obi na-azọ ọkwa onyeisiala na osote ya n'okpuru PDP nọ n'Aba dị n'Abịa steeti ebe ha na-ezute ndị mmadụ na ọgbakọ obodo nke a kpọrọ "Townhall meeting".
Atiku na Obi na Secondus kwuru okwu gbasara ike ọrụ, nchekwa, ọdụ ụgbọmmiri na ihe ndị ọzọ.
Atiku kwuru na o kwenyere na "Restucturing".
Ihe Atiku kwuru:
- Ọ bụrụ na mba ndị Naịjirịa karịchara nwere ikike iji teknụzụ mee ka azụmahịa ha na-aga n'ihu, ahụghị m ihe ga-eme ka anyị ghara imenwu ya.
- O kwesịrị ka ị nwee ike iji kọmputa gị debanye aha ụlọahịa gị n'akwụkwọ gọọmentị n'ime ụlọahịa gị.
- O nweghị onye nọ na gọọmentị a ghọtara ihe gbasara ọdụ ụgbọmmiri(ports) ka m si wee ghọta ya.

Ebe foto si, Getty Images
- Onne na Calabar Ports: Amaghị m ihe mere na Ndị igbo na-atụbata ahịa anaghị esizi n'Onne na Calabar atụbata ahịa. Ọ bụ na ọ ka ada ọnụ isi ebe ndị a? Ọ bụrụ na anyị nye ha ihe agbamume, ha ga-alọghachị.
- Ugbua, e nwere ihe ruru ndị ntorobịa nde 15 na-enweghị ọrụ, ọ bụ ihe a so bute nsogbu nchekwa na oke ogbugbu mmadụ na Naịjirịa.
- Abụ m onye nwere ezi nkwenye na 'restructuring'
- Nchekwa dị mkpa ka i nwee ike na-agara onwe gị ahịa gị na-abata na-atụghị ụjọ.
- Anyị ga-eke ọrụ. Ị kewapụta ọrụ, ị meela ka akụnaụba mụbanye.
- Echeghị m na Naịjirịa enwetụla ụdịrị ndị ndu a (Atiku na Obi) n'ọchịchị kemgbe Naịjirịa ji nwere onwe ya. Ị rụọ ụka a, tụnyere anyị.
Ihe Obi kwuru:
- A na-ekwu na APC na-eke ndị mmadụ puku iri. Puku naira iri ọ ga-azụtanwu otu akpa osikapa Abakaliki?( Ndị mmadụ zara ya sị "Mba" )
- Puku iri na abụọ ka a na-ere otu akpa osikapa si Abakaliki ugbua. Puku iri na abụọ a ga-ebidonwu ahịa osikapa?
- Gọọmentị anyị ga na-agbazinye ndị SME ego ha ga-eji akwado azụmahịa ha.
- Anyị ga-ewetu ego ole a na-akwụ na ego mgbazite n'ụlọakụ.
- Ihe gbasara ọdọmmiri e si atụbata ahịa doro Atiku anya.
Ihe Secondus kwuru:

Ebe foto si, Facebook/Secondus
Onyeisi otu pati ahụ bụ Uche Secondus, kwuru okwu ebe ọ na-ekwu na ihe niile nọ na Naịjirịa akpụọla afọ n'ala.
- O kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isioche, mana ọ maghị ihe na-aga n'obodo.
- Ọ jụrụ ndị mmadụ sị "onyeisiala ọ ma na mpụ na nrụrụaka na-aga n'obodo? Ọ ma na a na-egbu ndị mmadụ aghara aghara? Ọ ma na agụụ na-agụ ndị mmadụ?"
- Nke ọbụla ọ jụrụ, ndị mmadụ etie mkpu sị "mba! Ọ maghị".
- O mechara kwuo sị "n'aka Atiku ka anyị ga-enweta Mandela nke Naịjirịa".
- Ọ gwara ndị mmadụ ka ha tunye vootu ha ma chekwaa ya n'ihi na ndị uweojii anaghị arụ ọrụ ha etu o kwesịrị.
- O kwuru na ọ bụrụ na ndị nchekwa na-arụ ọrụ ha ọfụma, na agaghị egbu Alex Badeh etu e si gbuo ya ụnyaahụ.
- Ama m na ndi Igbo niile bụ ndị na-agba mbọ.





