You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Atiku bụ Bureau de Change - Mbaka
Ụkọchukwu Ejike Mbaka kpọrọ Atiku 'Bureau de change' n'ihi ụdị ego igwe akụkọ kwuru banyere ndị mmadụ n'aka n'oge PDP mere ntuliaka imeụlọ ha na Portharcourt.
Mbaka kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ozi chukwu n'ụlọụka ya bụ 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu.
N'okwu ya "Ọ bụrụ na Buhari bụ 'change' Atiku n'onwe ya bụ 'Bureau de change'.
O kwuru na Atiku ga-emeri Buhari na ntuliaka afọ 2019, kama ka ọ ghara isoro nzọm ụkwụ Buhari.
Onye ụkọchukwu a rịọrọ ka uche Chineke mezuo n'ebe Naịjirịa nọ.
O kwuru na Buhari were ohere ọma Chineke nyere ya tufuo n'efu site n'ịkpa oke agbụrụ n'inye ndị Naịjirịa ọrụ.
Cheta na Mbaka n'afọ 2015 dọnyere Buhari ukwu ebe o kwuru na ọ ga-emeri na ntuliaka nke afọ ahụ.