You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ị ga-esi ji N5000 debanye aha ụlọahịa gị n'akwụkwọ
Ndị ọrụaka na ndị mgbere e nwela ohere ọhụrụ iji debanye aha n'akwụkwọ n'ọkara ego eji emebu ya site n'ọnwa October 1 ruo December 31, 2018.
Osibanjo belatara ego a n'ọgbakọ mmụta nke iri na itoolu ndị akaọrụ na ndị mgbere mere n'ụbọchị October 2 n'Enugwu.
Osibanjo kwuru na nke a bụ iji kwado mkwa gọọmentị kwere maka ị mee ka ọnọdụ eji eme azụmahia na Naịjịrịa dị fecha fecha.
O kwuru na ndị na-atụ mgbere ahịa bụkarị ndị na-eme ka akụ na ụba Naịjirịa gbagote elu ya mere onyeisiala jị gba mbọ ị hụ na nwetere ihe ọ bụla ga-enyere ha aka n'ịzụ ahịa ọfụma ma nweta nnukwu uru.
O kwuru na ihe mere eji wepụta ya bụ ohere bụ na gọọmentị ha chọpụtara na ụfọdụ na-azụ ahịa na-abịa ya bụ ọgbakọ adịghị enwe ohere ị debanye aha ụlọ ahịa a n'akwụkwọ maka ọnụ ego dị oke ọnụ.
Osibanjo kwuru na ọ bụ ihe ndị ọ bụ ọrụ ha ị debanye aha n'akwụkwọ na-eme kwa mgbe mgbe n'ọgbakọ ahụ ịji hụ na ha weturu ọnụ ego eji eme ya.
Akụkọ ndị ga-amasị: