Ọghọm karịrị uru dị n'ịṅụ mmanya
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Egwu Eke nke atọ onye ka a na-akụrụ ya?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo akatọọla amụmụa Egwu Eke nke atọ gọọmentị chọrọ ibido na mpaghara ahụ.
Ha sị na ewere ego a chọrọ iji gba ya bụ Egwu Eke tinye n'ọrụ n'akụkọ ebe ndị ọzọ a na-enwe ọgbaaghara na Naịjirịa na udo ga-alohachite.
Ehibela Kọmiti ga-ahụ maka ahụike na Ọwụwa Anyanwụ Naijiria

Ehiwela kọmiti ga-ahụ maka ahuike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ South East Consultative Committee on Health.
Gọvano Ifeanyi Ugwuanyi bụ onye hibere n'aha ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ụnyaahụ Tọọsde kwuru na ọrụ ha gụnyere ikpokota na ịgbasa ozi ahụike n'ime obodo nakwa iwepụta ụzọ a ga esi mee ka ọrụ ahụike kwuru chim na mpaghara ahụ.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchikọta otu biafra a kpọrọ BIM akpọọla oku ka ụmụ Igbo dum bido ikwu ụtụisi na ụlọọrụ ha dị gị nso maka nwereonwe Biafra.
Ozị a dị na akwụkwọ Ralph Uwazuruike zigara ndị ntaaakụkọ na Tọọsde.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọkamụta enyopụta na ọghọm dị na ịṅụ mmanya kariri uru ya.
Nke a dị n'akwụkwọ nchọpụta ha mewere kemgbe afọ iri abụọ na isii (26) bụ ebe ha chọpụtara na mmanya nwere ike ịbute ọrịa kansa.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Ọzọ dịka ibe ya anwuchiela ihe ruru mmadụ puku bụ ndị asịrị ṅụrụ mmanya bịa ikiri egwuruegwu bọọlụ ndị Burnley na Olympico na Greece.
Amakanyere otu onye bịara ikiri asọmpi bụ otu n'ime onye kwadọ ndị Burnley mma n'asọmpi ahụ nke e meriri ndị Burnely.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:











