Lee onye Igbo na-ekwuchitere ụlọọrụ DSS ọnụ ọhụrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Aha ndị DSS anaghị atọcha ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ụtọ maka mkpa mkpa ha na-akpawa n'obodo a.

Mana ndị Igbo nwekwara ike ị ṅụrị ọnụ n'ozi a na-ekwu na ahọpụta nwafọ Igbo dika onye ga na-ekwuchitere ndị DSS ọnụ.

Ha kpọpụtara aha nwoke ahụ dika Mazi Nnọchirionye Afunanya.

Akwụkwọ ozi ha depụtara goziri na Afuanya gụrụ asụsụ Bekee na Mahadum Abia steeti nakwa Mahadum Uyo.

Ha depụtara na Afuanya turu ugo mmụta n'ihe na agụmaakwụkwọ gbasara iweta udo na nhazi Obodo na Mahadum Ilorin.

Ụgbua Afunanya na-agụ ihe mmụta dọkịta na Mahadum Nasarawa.

Ọ gụkwara akwụkwọ gbasara ntaakụkọ na nhazighari Obodo na Mahadum dị na mba ofesi.

Afunanya bụ onye otu ''Nigeria institute of Chartered Arbitrators, Nigerian Red Cross na Nigerian Institute of Management.''

Akụkọ na-ekwu na Afuanya ga-anọchite anya Tony Opuiyo onye ụfọdụ na-ekwu na ahụtụbeghị ya anya mbụ.

Lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara nhọpụta Afunanya n'igwe soshal midia.

@emma_evwaraye na-ajụ ma onye ọhụrụ a ga-anọnwụ n'oche ahụ?

@Ejimtrix kwuru si na-emere nhọpụta a n'oge ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC wee were Afunanya mezue ebum n'obi ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: