Akụkọ dị mkpa n'abalị a: A tọghapụla Lawal Daura ma kpachie akwụkwọ ikike njem ya
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ dị mkpa n'abalị a:

Ebe foto si, Dele Momodu Twitter
Ndị ụlọọrụ nchekwa atọghapụla Lawal Daura bụbu onyeisi Ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ DSS n'aha ịchafụ ma nara ya akwụkwọ ikike njem ya.
Cheta na a chụrụ ya n'ọrụ ma nwụchie ya ụbọchị abụọ gara aga, maka izipu ndị ọrụ ya ka ha gaa wakpoo ụlọomeeiwu ma gbochie ndị ụlọomeiwu ịbanye n'ụlọọrụ ha.
N' aka ọzọ, Matthew Seiyefa bụzị onyeisi ọhụrụ na DSS akwadola ịnọzịgharị ọnọdụ etu ụlọọrụ ahụ na-akpa ike nọ.
O kwuru na ọ ga-agba mbọ ịhụ na ngalaba ya lebara anya n'ebubo mmegide na mkpagbu e boro ụlọọrụ ha, ma kwuo na ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-ejikọ aka igbo ọgụ nsogbu nchekwa n'ala Naijirai.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: 'Ihe ndị m ga-elebanye anya dịka onyeisi DSS ọhụrụ'
EFCC wakpọrọ Ekpenyong onyebụbu onyeisi DSS

Ebe foto si, @officialEFCC
Nke dị ka ibe ya bụ na ngalaba na-alụ ọgụ megide nrụrụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ wakporo ụlọ onyebụbu onyeisi ndị DSS bụ Ita Ekpenyong n'Abuja ma nyocha ya ihe karịrị awa abụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Dịka akwụkwọ akụkọ Punch siri kọwaa, nke a na-eme ka ọ gachara ọnwa iri DSS n'oge Lawal Daura dịika onyeisi gbochiri ha inyocha maọbụ nwụchie Ekpenyong na agbanyeghị mkpebi ụlọikpe nyere iwu ka ha mee otu ahụ.
Ebe ọzọ na Naịjirịa:

Ndị obodo Nkwe na Ezere dị n'Enugwu steeti arịọla doo doo doo, biko biko biko, sị ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka maka akwammiri jikọrọ ha na ndị obodo ọzọ chọrọ ịda.
Ha sị na ọ bụrụ na akwammiri a rụrụ n'afọ 1947 mgbe ndị si agha Burma lọtara daa, na ha enweghịzị ụzọ ọzọ ha ga-esi na-abata ma na-apụ obodo ha.
Lee ya n'uju ebe a: Akwa a daa, mmekọrịta anyị na ụwa ga-ebi - Ndị Nkwe
Mba Ofesi:

Ebe foto si, Reuters
Na mba ofesi, ihe na-ebute anya mmiri na mgbawa obi emeela na mba Yemen.
Ihe ruru ụmụaka iri abụọ na itoolu anwụọla ebe iri atọ merụrụ ahụ ka ndị agha si Saudi tụrụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ha na mpaghara ugwu Saada.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, NFF Twitter
Ndị otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa nta bụ Falconets ji otu ọkpụ merie Haiti ka ha abụọ zutere n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị na-agafeghị afọ iri abụọ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Ị hụla nwaanyị Igbo a na-eji ịnya ụgbọala akpa ego?











