Akụkọ dị mkpa n'abalị a: Akpabio agbaghapụla PDP bụrụ onye APC n'eziokwu
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ dị mkpa n'abalị a:

Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio Facebook
Okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ na Sinetọ Godswill Akpabio bụbu gọvanọ Akwa Ibom steeti emeela ihe dị ya n'obi.
Taa ka Akpabio kwuputara na ọ gbajọọla PDP gafee APC.
Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ebe foto si, Abubakar Bukola Saraki Facebook
Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ekwuola na obi anaghị amapụ ndị omeiwu maka mgbochi e gbochiri ha ụnyaahụ.
O kwuru nke a ebe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ọ kpọkuru taa n'Abuja.
Gụọ akụkọ n'uju ebe a: Mkparị ọbụla e nyere ụlọomeiwu bụ ụmụ Naịjirịa ka e nyere ya - Saraki
Mba Ofesi:

Ebe foto si, AFP
Ihe ọma emeerela Simone Gbagbo bụ nwunye onye bụbu onyeisiala ndị Ivory Coast taa,
Ọ pụtara n'ụlọ mkpọrọ taa ka ọ nọchara afọ atọ n'ime iri abụọ a gụnyeburu na ọ ga-anọ.
Cheta na onyeisiala ndị Ivory Coast bụ Alassane Ouattara, gbagharala ya na ihe karịrị mmadụ 700 ndị ọzọ nso nso a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, NFF Twitter
Otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke nta Naịjirịa a kpọrọ 'Falconets' na otu Haiti ga-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mbaụwa U-20 echi.
Cheta na Germany ji otu ọkpụ merie ha n'egwuregwu nke mbụ ha gbara n'asọmpi a.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Otu obodo dị n'Enugwu na-atụ ụjọ na akwa mmiri ha daa, ha na ndị obodo ndị ọzọ agaghị enwezị mmekọrịta ọzọ.










