Kedu ebe osote gọvanọ Akwa Ibom kwụ?

Moses Ekpo

Ebe foto si, Akwaibom state govt website

Nkọwa foto, Ekpo si na ya ka kwu chim na PDP
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ugbua bụ oge ntụgharị n'ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ, nke mere onye achọrọ n'elu akwa n'abalị, ebube agaghị ada ma ahụ ya n'ezi.

Ya mere ndị mmadụ ji a sị ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kwupụta pati ha kwụ n'azụ.

Nke na-eme ugbua bụ na osote gọvanọ Akwa Ibom steeti bụ Moses Ekpo, bụ onye a sị tichara aka na ọkpa wee tinye akwụkwọ arụkwaghịm ụnyaahụ.

Maazị Ekpo, onye ndị ntaakụkọ ụfọdụ kwuru na ọ ga-esoro onye bụbu gọvanọ steetị ahu bụ Godswill Akpabio gafe pati APC, bụkwa onye akụkọ na-ekwu na ọgọrọla ụkwụ na aka.

Ekpo kwukwara na ya ka nọ na pati Peoples Democratic Party (PDP).

Ọnu na-ekwuru Ekpo bụ Ekikere Umoh bu onye kwuru nke a.

Ọ si na njem Ekpo gara ugbua bụ ozi aka na-achị steeti ahụ bụ Udom Emmauel ziri ya. Ozi a metụtara nzụkọ ndị Ati Annang nwere na obodo New York dị na mba Amerịka.

Cheta na akụkọ nọ n'ikuku na-ekwu na Godswill Akpabio na-ejikere ị maba pati na-achi Naịjirịa bụ APC.

Unyaahụ, Akpabio na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere mkparịtaụka na London. Mana, ka ndị mmadu ka na-eme ka ha ọghọta ihe nzụkọ ahụ pụtara, foto pụtara na Twitter na-egosi ya na onyeisi APC bụ Bola Tinubu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Amabeghi etu okwu a ga-esi gaa, mana etu obụla asị gba ya bụ egwu, anya anyị ga-adị na ya, ịhu na unu nụrụ ya.