You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ ndị dị mkpa: Ọkụ erepiala mmadụ 74 na Greece
Ọkụ erepịala ihe karịrị mmadụ iri asaa na anọ nakwa ụgbọala ole na ole na mpaghara Attica na mba Greece.
Ndị ụlọọrụ kwuru na ha hụrụ ebe ozu ndị mmadụ makụrụ onwe ha wee nwụọ oge ọkụ ahụ nọchiri ha ụzọ ịgba ọsọ.
N'akụkọ ndọrọndọrọ ọzọ, BBC na-anụ na ndị ụlọomeiwu sinetị otu nari na itoolu agaala ụlọ osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremadu iji nye ya nkwado ma gwaa ya na ha kwụsị ya ike n'azụ.
Cheta na ndị EFCC gbochiri Ekweremadu ịpụ n'ụlọ ya n'ụtụtụ a n'Abuja.
Ndị ụlọomeiwu ukwu sineti mmadụ iri na ise gunyere Dino Melaye, Rabiu Kwankwaso hapụrụ otu APC gafee PDP na ADC taa.
N'otu aka ahụ, mmadụ iri atọ na asaa nọ n'ụlọomeiwu nta pụkwara na pati apc wufere na PDP nakwa ADC .
Mana otu APC ekwuola na pati ha kwụsịrị ike.
Messi, Ronaldo, Salah, Mbappe nakwa Midric esorola na ndepụta aha FIFA mere iji gosi ndị nwere ike irite nturuugo 'ọkachasị agba bọọlụ n'ụwa niile'
Gee akụkọ nke taa n'ime otu nkeji
Ihe onyonyo nke taa