Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ihe onyonyo egosila onye nchịkọta bọọlụ Naịjirịa ka ọ naara ego

Ihe onyonyo egosila onye nchịkọta bọọlụ Naịjirịa na-anata ego

Ihe onyonyo ụlọọrụ 'BBC African Eye' wepụtara egosila otu onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa bụ Salisu Yusuf, ka ọ dị ka ọ natara ego iji tinye aha mmadụ abụọ so gbaa asọmpi CHAN nke afọ 2017.

Mana Salisu kwuru na ọ daghị iwu FIFA nakwa nke NFF; na nghọpụta o mere bụ nke ziri ezi.

Achụpụla ndị batara n'Enugwu n'ụzọ ezighi ezi

Ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ bụ 'Immigration Service' na Bekee nke Enugwu steeti, ekwuola na ha anwụchiela ma chụlaa mmadụ iri asaa na ise (75) batara Enugwu n'ụzọ na-ezighi ezi.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Dora Amahian, kwuru na ọtụtụ n'ime ndị a si na mba Niijee nakwa mba Kameroon.

Saraki asaala oku ndị uweojii kpọrọ ya

Onyeisi ndị ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki asaala oku ọzọ ndị uweojii kpọrọ ya maka ohi e zuru n'ụlọakụ dị n'Offa, Kwara Steeti. O kwuru na oku a bụ nkatọ aha n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi si n'aka onye ndụmọdụ ya na mgbasa ozi bụ Yusuph Olaniyon.

Ụmụaka tọrọ n'ọgba Thailand ga-abụ ndị Mọnk

Ụmụaka egwuregwu bọọlụ Thailand ga-enweta echichi ndị mọnk mana otu n'ime ha agaghị eso makana ọ bụ onye okpukpere ụka Kraịst.

Nke a bụ omenaala ndị mba Thailand na-eme maka ndị gabigara ihe ike na ndụ.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a:

Nkeji nke ụtụtụ a:

Ihe Nkiri nke taa: