Ntuliaka 2019: Chris Okotie esonyela n'ọsọ ọkwa oyeisiala
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Gọọmenti etiti ekwuola na mmeri Fayemi meriri n'Ekiti steeti gosiri na ndị mmadụ nabatara ọchịchị onyeisiala Buhari.

Ebe foto si, Getty Images
Mịnịsịta okwu mgbasaozi dị n'aka bụlai Mohammed kwukara na mmeri ahụ mechiri ọnụ ndị na-ebu ozi okwu asị.
Naịjirịa
Ndị chọrọ ịba ọkwa onyeisiala na 2019 na-abawanye ụba.

Ebe foto si, Ahmed Buhari/Fela Durotoye/Yul Edochie
Otu onye ọzọ ekwupụtala ebum n'obi ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.
Onye a bụ ụkọchukwu ndị Household of God Church bụ Chris Okotie.
Nke a ga-emekwa ya ugbo anọ Okotie ga-azọ ọkwa ebe ọ zoburu n'afọ 2003, 2007 na 2011.
Akụkọ mba ofesi
Trump enyela Theresa May ndụmọdụ tara akpụ

Aka na-achị mba UK bụ Theresa May ekwuola na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump gwara ya ka ọ kpụpụ otu EU ụlọikpe kama ịkparịtaụka maka Brexit.
Trump ekwubuola na o nwere ihe ọ gwara nwaanyị May ka ọ mee man May chere na o siri ike.
N'egwuregwu,
Novak Djokovic alaghachiela n'elu Wimbledon.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu Novak Djokovic emeriela Wimbledon nke anọ oge ọ gbapụrụ Kevin Anderson.
Djokovic nwetara nturuugo mbụ Grand Slam ya kamgbe ihe karịrị afọ abụọ site na mmeri ahụ.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:










