You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Victor Umeh: Emere m ihe ọjọọ wee kwado Rochas
Sinatọ Victor Umeh kwuru na o mere ihe ọjọ wee mere Gọvanọ Rochas Okorocha ndọrọndọrọ ọchịchị ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.
O kwuru na Okorocha abụghị ezigbo mmadụ makana ọchịchị ya ataala ndị Imo steeti ahụhụ.
Umeh kwuru nke a mgbe o na-emepe ngalaba "Senator Victor Umeh Support Group" n'okpuru ọchịchi Anaocha dị n'Anambara steeti maka ntuliaka ga-eme na 2019.
Ọ sị na ọ ka na-achọ ighọta ihe mere Okorocha jiri wepu osote ya bụ Eze Madumere.
Umeh kwuru na o chetara ka Madumere sị gbaa mbọ hụ na ọchịchị Okorocha gaziri nke ọma.
N'okwu ya, a tụrụ Madumere mkpọrọ makana ọ na-akwado Gọvanọ Rochas, o rue ụgbụa Rochas ewepu Madumere makana ọ chọrọ ka nwoke na-anụ nwa ya bụrụ Gọvanọ Imo steeti.
Umeh kwuru na Gọvanọ steeti ahụ wepụrụ osote ya mbụ n'afọ 2013, nke gosiri na ihe adịchaghị mma na ebe Okorocha nọ makana o kwesịghị ị bụ naanị ya ga na-abụ ''ezigbo mmadụ'' mgbe ọ bụla
ma a bịa n'ihe gbasara ihe ya na ndị osote ya na-eje.