You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a: Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ a
Akụkọ ndị dị mkpa.
Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha dị njikere ị tụ ndị ịsị ahịa dị ịcheiche nga maka mkpachị ego kwesiri ị ru gọọmentị aka
Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na steeti ahụ bụ Christian Madubuko kwuru na gọọmentị etufuola ijeri naira ole na ole maka mpụ a.
Osote onye na-anọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ David Young arịọla gọọmentị etiti ha mee ihe ga kwụsị oke ogbugbu mmadụ na mpaghara etiti Naịjirịa.
O kwuru nke a mgbe ọ gara ị leta aka na-achị Plateau bụ Simon Lalong ụnyaahụ.
Praim Minister mba Briten bu Theresa May ga-ezute ndị minista ya n'ụtụtụ ebe Jeremy Hunt ga-anochite anya Boris Johnson dịka onye odeakwụkwọ mba ofesi
N'akụkọ yiri ibe ya Donald Trump ahọpụtala Brett Kavanaugh dịka ọkaịkpe ukwu n'ụlọịkpe kachasị nke mba Amerịka
Ngalaba na-ahụ maka bọọlụ na Argentina ekwuola na ha ga-enyocha ọkwa onyenchịkọta otu egwuregwu ha bụ Jorge Sampaoli na ngwụcha ọnwa a.
Ebe igwe mmadụ na mba Britain ebidola ị gaa mba Rọshịa maka asọmpị dị n'etiti ha na mba Kroeshia echi.
Gee nkeji nke ụtụtụ a
Ihe onyonyo nke taa