Akụkọ kachasị n'abalị a: Nwaagbọghọ nwụrụ n'ụlọ enyi ya nwoke

ideremmiri gburu mmadụ na Nsukka

Akụkọ na-eru BBC ntị na-akọ na ideremmiri egbuola ihe dị ka mmadụ atọ na Nsukka, Enugwu steeti

Mmadụ atọ ahụ nke gụnyere nwatakiri gbara afọ 5 si ụlọakwụkwọ alọta ka ya bụ oke idere mmiri chichapụrụ ụkwụ n'ala ma bụrụ ya na-aga tupu ahụ ya bu ga ụlọ ọgwụ dịka nta akụkọ siri buo.

Azọpụtala mmadụ anọ n'ime mmadụ iri na abụọ idemmiri ribidoro na ọgba Taịland

Na aka ọzọ, nne na nna ụmụrụ ụmụ 9 n'ime 12 bụ ndị tọrọ atọ n'ime ọgba Taịland ka ga-achị obi ha n'aka otu abalị ọzọ. ebe akpọpụtalara mmadụ anọ n'ime ụmụaka ahụ.

A na-elete mmadụ anọ ndị ahụ anya n'ụlọọgwụ ka ọ dị ụgbụa.

Nwaokorobia ahụrụ ozu enyi ya nwanyi n'okpuru akwa

Ndị ụweojii agbala ama ka otu nwaagbọghọ bụ nwa osote gọọvanọ ondo steeti chibugoro ka ahụru ozu ya n'okpuru akwa enyị ya nwoke.

Adenike Khadijat Oluboyo bụ onye a na-achọ achọ kemgbe abalị 6 ka atụrụ anya na ọ ga agụcha akwụkwọ ya na afọ ọzọ gara ihu enyi ya nwoke akpọrọ Adeyemi Alao.

N'egwuruegwu Iko mbaụwa

Fernando Hierro etinyele akwụkwọ arụkwaghị na Spen

Kochi ndị Spen bụ Fernando Hierro achiliela aka ka achụpụchara ha n'Iko Mbaụwa. Rọshịa ji penariti gbapụ spen na ịzuụka gaara aga.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Lee ihe nkiri anyị