You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ipob sị na Okorocha na-achọ uru isi ya
Na iza okwu gọvanọ na achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru na nkata ya na BBC Igbo kpara, Ipob sị na ha achọghị ibute agha na Naịjirịa dika ha sị na Okorocha si kwuo.
Ha gakwara n'iru si na uche ha gọvanọ Okorocha esoghị na ndị ha (Ipob) na-akpọ onye Igbo.
BBC Igbo kpọrọ otu na ndị na-ekwuchitere Ipob bụ onye akpọrọ Ụkọchukwu Peace n'elu ekwenti.
Peace si na Ipob bụ otu udo na-achọghị nsogbu ọbụna.
Gee ihe ndị ọzọ ọ gwara anyị n'elu.