Akụkọ kachasị n'abalị a: Ohaneze na Ipob onye tinye mma ya n'ọbọ

Ipob gwara ndị otu ha deere duu

Ụkọchukwu Peace, bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchiri otu Ipob kwuru na ha na Ohaneze Ndịgbo nọ na ọnọdụ onye tinye mma ya n'ọbọ ugbua.

Peace kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ ka akụkọ pụtara na udiri ihe ahụ na-eme.

Idere mmiri na anịozize egbuola ọtụtụ mmadụ na Hiroshima, Japan

Ide mmiri na ala ozize egbuola ọtụtụ mmadụ n'obodo Hiroshima nke mba Japan.

Ihe mberede a mere ka gọọment mba ahụ nye iwu ka mmadụ ruru otu nde na narị ise (1,500,000) kwapụ ebe ha be.

Agwakwara mmadụ nde atọ ọzọ na ọkakwara ha mma iji ehihi chọwa ewu ojiri.

MKO Abiola nwuru udi mgbe a na 1198]

Tata ka onye a na-eche na ọ bụ ya meriri na ntuliaka nke 1993 bụ MKO Abiola nwuru. Abiola nwuru na nga na afọ 1998.

Nwafọ Ọnụ a eru na-okwu bụ Micheal Chimezie Nnabuchi gwara BBC IGBO na Abiola bu mmadụ oha, bukwara onye ndị mmadụ binyere aka agbanyeghị ebe ha sị.

N'egwuruegwu Iko mbaụwa

Ingland ataala isi Swiden

Na iko mbaụwa, Ingland ji ọkpụrụkpụ ọkpa gbakacha Swidin ahụ.

Maguire na Alli bụ ndi sukara net ndi Swiden na nkeji iri atọ nakwa nkeji iri ise na asaa n'ime asọmpị ahu

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Lee ihe nkiri anyị