You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ekweremadu ga-akwado iwu steeti ọbụla inwe uweojii nke ha
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a
Aga m akwado iwu steeti inwe ndị uweojii nke ha - Ekweremadu
Osote onyeisi ndị Sinetị bụ Ike Ekweremadu ekwuola na ọ ga-akwado akwụkwọ iwu nke ga-enye ikike ka e nwee ndị uweojii nọ n'okpuru steeti.
Ekweremadu kwuru na oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu n'ihi na mpaghara dị iche iche na Naijiria enweghị ikike iwe ndị uweojii nke ha n'ọrụ.
Onyeisiala Mba Frans ga-awụchi Naịjirịa
Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron ga-esi mba Mọrịtenịa ebe ọ gara ọgbakọ otu ndịisi mba Afrịka bịa Naijiria, ebe ya na onyeisiala Buhari ga-enwe mkparitaụka gbasara okwu nchekwa nakwa iyiegwu nke bekee kpọrọ 'terrorism'.
Macron ga-abịakwa Legọs n'abalị atọ nke ọnwa Julaị, ebe Gọvanọ Steeti bụ Akinwunmi Ambode ga-ele ya ọbịa na 'African Shrine' bụ ụlọ onye otiegwu bụ Fela kuti.
N'akụkọ mba ofesi
Saụt Korea ebudatala elekere ole ndị ọrụ ha ga na-arụ ọrụ site n'elekere iri isii na asatọ gbadata rue elekere iri ise na abụọ.
Nke a bụ iji nyere di na nwunye aka inwe ohere ịnọkọta ọnụ. Nke a bụ iji kwalite ọmụmụ na-agbada oke mgbada na mba ahụ.
N'egwuregwu,
Ọ rara ndị Rọshịa ahụ imeri ndị Spen na-agba nke abụọ asọmpi Iko Mbaụwa, ka asọmpi ha banyere penariti, ebe Rọshịa ji 5-4 mmerie.
Ọzọ, mba Kroeshia na Denmak ga-ezute ibe mgbe ọ kụrụ elekere asaa nke abalịa.
Gee nkeji nke abalị a ebe a