You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọkụ Otedola: Ị jụọla ese nwanne gị? Lee ihe ndị mmadụ mere
Chi jiri ehihie jie ụnyaahụ mgbe gwongworo bu mmanụ agbidị gbara ọkụ n'akwa Otedola dị nso na Berger nke dị n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan.
E mechara ozi si n'aka onyeisi ndị na-achịkọta nchekwa njem ụgbọala nke a kpọrọ FRSC n'aha ịchafụ na Legọs steeti bụ Hyginus Omeje kọwa na ọ bụ mmadụ itoolu nwụrụ, ebe ụgbọala 54 gbara ọkụ.
Ka akụkọ gbasara, ndị mmadụ bidoro ịkpọ ekwenti nakwa usoro mgbasa ozi dị icheiche iji jụọ ese umunwanne ha, ndị enyi na agbataobi ha bi na Legọs.
Paul Ibeh kwuru na kemgbe ọ nụrụ kepukepu okwu a, ọ nọ na-akpọ ndị ezinaụlọ na ndị enyi ya.
ZowskaL kọwara ihe mere ma dụọ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha kpọọ ndị dị ha mkpa ị mara maka ọdịnma ha.
N'otu aka ahụ, Akeem Alarọ rịọrọ ndị mmadụ ha kpọọ ndị be ha jụọ ase ọdịnma ha.
Ebe Obiblaq na-ekwu na ndị be ya malitere ịkpọ ya mgbe ha nụrụ kepukepu okwu ahụ.
Ihe kpatara nke a bụ na a mabeghị ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na ndị merụrụ ahụ n'ihe mberedere ahụ.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ ị mata ihe mere, o zuru ụfọdụ ndị mmadụ ebe ha na-eche ịnụ ozi gbasara ụmụnwanne ha nọ n'ụlọọgwụ.
Ọ bụ ebe elekere ise nke mgbede ka akụkọ gbasara na enweela ihe mberede ụgbọala na mpaghara Berger nke Legọs steeti.